Aisaia Chapter 34

For English

Read Aisaia Chapter 34 Online

Read Aisaia Chapter 34 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Aisaia and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Aisaia 34

Isi 34

1. Bianu nso, unu mba, inu ihe; unu ndi di iche iche kwa, ṅanu nti: ka uwa nu, ya na ùjú-ya; elu-uwa dum madu bi, na ihe nile si nime ya aputa.

2. N'ihi na iwe ka Jehova nēwesa mba nile, O wezugawo ha ka ebibie ha, O were ha nye ka eb͕ue ha.

3. Agētufu kwa ndi-ha eb͕uru eb͕u, ma ozu-ha, ísì ọjọ ha gārigo n'elu, agāb͕aze kwa ugwu site n'ọbara-ha.

4. Usu nile nke ihe elu-igwe gēdè kwa, agāpiakọta kwa elu-igwe dika akwukwọ-odide: usu-ha nile gākpọnwu kwa, dika akwukwọ si akpọnwu dapu n'osisi vine, na dika akwukwọ nke nākpọnwu akpọnwu si adapu n'osisi fig.

5. N'ihi na mma-agham aṅujuwo afọ n'elu-igwe: le, Edom ka ọ gāridakwasi, ridakwasi kwa ndi M'wezugara ka ebibie ha, ikpe ikpe.

6. Mma-agha Jehova juputara n'ọbara, emewo ka ọ ma abuba site n'abuba, site n'ọbara umu-aturu na nkpi, site n'abuba nke akuru ebulu: n'ihi na àjà di Jehova nwere na Bọzra, O nwe-kwa-ra oké ob͕ub͕u n'ala Edom.

7. Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n'abuba.

8. N'ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di Jehova nwere, arọ nkwughachi diri ise-okwu Zaion.

9. Iyi-ya nile gāb͕anwe pitch, ájá-ya gāb͕anwe kwa brimstone, ala-ya gāghọ kwa pitch nēre ọku.

10. N'abali ma-ọbu n'ehihie ọ gaghi-anyu anyu; rue mb͕e ebighi-ebi ka anwuru-ọku-ya gākwugo: site n'otù ọb͕ọ rue ọb͕ọ ọzọ ọ gātọb͕ọrọ n'efu; rue mb͕e nile ebighi-ebi ọ dighi onye nāgabiga nime ya.

11. Ma okwolo na ebinta gēnweta ya; okwukwu na ugolo-ọma gēbi nime ya: Ọ gēseti kwa eriri nke itọb͕ọrọ-n'efu na nkume-ọtùtù nke itọb͕ọrọ-nkiti n'elu ya.

12. Ndi-ya amara aha-ha ka ha gākpọ inwe ala-eze, ma ọ dighi onye nọ n'ebe ahu; ndi-isi-ya nile gāghọ kwa ihe-efu.

13. Ogwu gēpú kwa n'ulo-elu-ya nile, akuba na ọhia-ogwu n'ebe-ya nile ewusiri ike: o we ghọ ebe-obibi nkita-ọhia, ogige nke diri enyi-nnunu.

14. Anu-ọhia bi n'ala kpọrọ nku gēzute kwa anu-ọhia nēbe ebe, nkpi-ọhia gākpọ kwa ibe-ya; ọzọ, n'ebe ahu ka lilith gānọdu, chọtara onwe-ya ebe-izu-ike.

15. N'ebe ahu ka agwọ di ngwa gēme akwu-ya, yie àkwá, bua umu, kpokọba ha n'okpuru ǹdò-ya: ọzọ, n'ebe ahu ka ndab͕u gēzukọta, otù na ibe-ya.

16. Chọputanu n'akwukwọ Jehova, gua: ọ dighi otù nime ndia fọduru inọ ya, otù eleghi anya ibe-ya ma ọ biagh: n'ihi na ọnum, nke ahu nyere iwu, Mọ-Ya kwa, Ya onwe-ya chikọtara ha.

17. Ya onwe-ya efewo-kwa-ra ha nzà, aka-Ya ewerewo kwa ya kère ha n'eriri-ọtùtù: rue mb͕e nile ka ha gēnweta ya, rue ọb͕ọ nile ka ha gēnwe ebe-obibi-ha nime ya.

About Aisaia Chapter 34

Read Aisaia Chapter 34 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Aisaia
Chapter: 34
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Aisaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Aisaia Chapter 34 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Aisaia Chapter 34?

Aisaia Chapter 34 is part of the Book of Aisaia in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Aisaia Chapter 34 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 7
  6. Esta Chapter 4
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Aisaia

  1. Aisaia Chapter 48
  2. Aisaia Chapter 43
  3. Aisaia Chapter 1
  4. Aisaia Chapter 65
  5. Aisaia Chapter 58
  6. Aisaia Chapter 33
  7. Aisaia Chapter 7

Related Chapters & Readings

  1. Aisaia Chapter 47
  2. Job Chapter 14
  3. Ezikiel Chapter 30
  4. Joshua Chapter 5
  5. Jeremaia Chapter 49
  6. I. Samuel Chapter 4
  7. I. Samuel Chapter 17
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *