Read Job Chapter 7 Online
Read Job Chapter 7 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 7
Isi 7
1. Ọ̀ dighi obubu-agha diri madu n'elu uwa? Ùbọchi-ya adighi ka ubọchi onye egoro ọlu?
2. Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò, Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:
3. Otú a ka emeworom ha m'keta ọtutu ọnwa nke ihe-efu, Ọtutu abali nke m'nādọb͕u onwem n'ọlu ka ha gutawo-kwa-ra nyem.
4. Ọ buru na edinam, m'si, Òle mb͕e m'gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya; Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ.
5. Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá; Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze.
6. Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà, Ha we gwusia nenweghi olile-anya.
7. Cheta na ndum bu ifufe: Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.
8. Anya onye nāhum agaghi-ekirim: Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.
9. Dika igwe-oji si agwusi, we la, Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.
10. Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ, Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.
11. Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum; Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm; Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.
12. Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri, Na I nēdo ndi-nche ichem?
13. Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi, Ihe-ndinam gēbupu ntamum;
14. I we were nrọ me ka m'tua ujọ, I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku:
15. Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u, Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.
16. Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.
17. Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku, Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,
18. Na I nēleta kwa ya ututu nile, Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile?
19. Rùe ole mb͕e ka I nāgaghi-elepum anya, Ka I nāgaghi-arapum rue mb͕e m'lodara ọnu-mirim?
20. Asi na emehiewom, gini ka m'nēme Gi, Gi Onye nēche madu? N'ìhi gini ka I doworom ibu ihe-ndakwasi n'ebe I nọ, M'we ghọrọ onwem ibu?
21. Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga? N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá: I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.
About Job Chapter 7
Read Job Chapter 7 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 7
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 7 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 7?
Job Chapter 7 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 7 online for free with easy chapter navigation.