Read Joshua Chapter 24 Online
Read Joshua Chapter 24 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Joshua and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Joshua 24
Isi 24
1. Joshua we chikọta ebo nile nke Israel rue Shekem, ọ kpọ ndi-okenye Israel, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha; ha we guzo onwe-ha n'iru Chineke.
2. Joshua we si ndi Israel nile, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, N'ofè Osimiri ahu ka nna-unu-hà biri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, bú Tira, nna Abraham, na nna Nehoa: ha we fè chi ọzọ di iche iche.
3. M'we si n'ofè Osimiri ahu kuru nna-unu, bú Abraham, me ka ọ nēje ije n'ala Kenean nile, M'we me ka nkpuru-ya ba uba, M'we nye ya Aisak.
4. M'we nye Aisak Jekob na Isọ: M'we nye Isọ ugwu Sia, ka ọ nweta ya; ma Jekob na umu-ya ridara n'Ijipt.
5. M'we ziga Moses na Eron, tie Ijipt ihe, dika ihe ahu si di nke M'mere n'etiti ya: emesia M'we me ka unu puta.
6. M'we me ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta: unu we biarue oké osimiri; ndi Ijipt we chiri ub͕ọ-ala na ndi-inyinya chua nna-unu-hà n'azu rue Oké Osimiri Uhie.
7. Ha we tikue Jehova, O we tiye oké ọchichiri n'etiti unu na ndi Ijipt, me ka oké osimiri biakwasi ha, O we kpuchie ha; anya-unu hu-kwa-ra ihe M'mere n'Ijipt: unu we biri n'ọzara ọtutu ubọchi.
8. M'we me ka unu ba n'ala ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan; ha we buso unu agha: M'we nye ha n'aka-unu, unu we nweta ala-ha; M'we kpochapu ha n'iru unu.
9. Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, we bilie buso Israel agha; o we ziga kpọ Belam nwa Beoa ikọcha unu:
10. ma ekweghm ige Belam nti; o we nāgọzi unu agọzi: M'we naputa unu n'aka-ya.
11. Unu we gabiga Jọdan, biarue Jeriko: ndi-nwe Jeriko we buso unu agha, bú ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; M'we nye ha n'aka-unu.
12. M'we ziga ebu n'iru unu, nke chupuru ha n'iru unu, bú eze abua nke ndi-Amorait; ọ bughi na mma-agha-gi, ọ bughi kwa n'uta-gi.
13. M'we nye unu ala nke i nādọb͕ughi onwe-gi n'ọlu nime ya, na obodo nke unu nēwughi, unu we biri nime ha; ubi-vine na ubi-olive nke unu nākughi ka unu nēri nkpuru-ha.
14. Ma ub͕u a, nātunu egwu Jehova, nēfè-kwa-nu Ya òfùfè n'izu-okè na ezi-okwu: wezuga-kwa-nu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè n'ofè Osimiri ahu, na n'Ijipt; ma fènu Jehova òfùfè.
15. Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.
16. Ndi Israel we za, si, Ya buru ayi ihe-árú irapu Jehova, ifè chi ọzọ òfùfè;
17. n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, Ya onwe-ya bu onye mere ka ayi na nna-ayi-hà si n'ala Ijipt, si n'ulo ndi-orù, rigota, Onye me-kwa-ra ihe-iriba-ama uku ahu nile n'anya-ayi, debe ayi n'uzọ ahu nile nke ayi jere ije nime ya, na n'etiti ndi nile nke ayi gabigara n'etiti ha:
18. Jehova we chupu ndi ahu nile n'iru ayi, bú ndi-Amorait ndi bi n'ala nka: ayi onwe-ayi gēfè kwa Jehova òfùfè; n'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi.
19. Joshua we si ndi Israel, Unu apughi ifè Jehova òfùfè; n'ihi na Chineke di nsọ ka Ọ bu; Chineke ekworo ka Ọ bu; Ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu na nmehie nile unu.
20. Mb͕e unu gārapu Jehova, fè chi ala ọzọ òfùfè, Ọ gēchighari kwa mejọ unu, me ka unu gwusia, mb͕e O mesiri unu nma.
21. Ndi Israel we si Joshua, É-è; kama Jehova ka ayi gēfè òfùfè.
22. Joshua we si ndi Israel, Ndi-àmà megide onwe-unu ka unu bu, na unu onwe-unu arọputaworo onwe-unu Jehova, ifè Ya òfùfè. Ha we si, Ndi-àmà ka ayi bu.
23. Ọ si, Ma ub͕u a, wezuganu chi ala ọzọ nile nke di n'etiti unu, do-kwa-ra Jehova, bú Chineke Israel, obi-unu.
24. Ndi Israel we si Joshua, Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēfè òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti.
25. Joshua na ndi Israel we b͕a ndu ubọchi ahu, o we doro ha ukpuru na ikpé nime Shekem.
26. Joshua we de okwu ndia n'akwukwọ iwu Chineke; o we were nkume uku, me ka o guzo ọtọ n'ebe ahu n'okpuru osisi oak ahu nke di n'ebe nsọ Jehova.
27. Joshua we si ndi Israel nile, Le, nkume a gābu àmà megide ayi; n'ihi na ọ nuwo okwu-ọnu nile nke Jehova nke Ọ gwara ayi: ọ gābu kwa àmà megide unu, ka unu we ghara igọnari Chineke-unu.
28. Joshua we zilaga ndi Israel, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya.
29. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, nwuru, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri.
30. Ha we lìe ya n'ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-sera, nke di n'ugwu Efraim, n'akuku Ugwu nke ugwu Gaash.
31. Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi ma-kwa-ra omume nile nke Jehova, nke O mere Israel.
32. Ha we lìe ọkpukpu Josef, nke umu Israel si n'Ijipt bugota, nime Shekem, n'òkè ọhia ahu nke Jekob zutara n'aka umu Hemoa nna Shekem n'ọgu nkpuru-ego ise: ha we ghọrọ umu Josef ihe-nketa.
33. Eleeza nwa Eron we nwua; ha we lìe ya n'ugwu Finehas nwa-ya, nke enyere ya n'ugwu Efraim.
About Joshua Chapter 24
Read Joshua Chapter 24 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Joshua
Chapter: 24
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Joshua. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Joshua Chapter 24 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Joshua Chapter 24?
Joshua Chapter 24 is part of the Book of Joshua in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Joshua Chapter 24 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from joshua
- Joshua Chapter 1
- Joshua Chapter 5
- Joshua Chapter 15
- Joshua Chapter 12
- Joshua Chapter 13
- Joshua Chapter 3
- Joshua Chapter 20