Read Ilu Chapter 18 Online
Read Ilu Chapter 18 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ilu 18
Isi 18
1. Ọchichọ nke ya onwe-ya nāchọsi ike ka onye nēkewapu onwe-ya nāchọ, Ọ bu ezi nzube-ihe nile ka ọ nālusosi ọ̀gù ike.
2. Nghọta adighi-atọ onye-nzuzu utọ, Kama ọ bu nání ka obi-ya we kpughe onwe-ya.
3. Mb͕e onye nēmebi iwu nābata, nleda-anya abatawo kwa, Ọ bu kwa nlelì ka ita-uta soro.
4. Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu; Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu.
5. Ihu onye nēmebi iwu iru-ọma adighi nma, Iwezuga onye ezi omume n'ikpé. Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye-nzuzu nābà n'ilu-ọ̀gù,
6. Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.
7. Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi, Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.
8. Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri nātọ utọ nke-uku, Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.
9. Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya, Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.
10. Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu: Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu.
11. Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike, Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile.
12. N'iru ntipia ka obi madu di elu, Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.
13. Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu, Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya.
14. Mọ madu gānagide ọria-ya; Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya?
15. Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma; Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma.
16. Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara, Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je.
17. Onye ezi omume n'anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya; Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya.
18. Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi, Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa.
19. Nwa-nne ejehieworo megide di ike iwere kari obodo siri ike: Ise-okwu di kwa ka ihe-ntuchi nile nke-elu.
20. Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju afọ onye ọ bula; N'ihe-omume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya ka afọ gēju ya.
21. Ọnwu na ndu di ire n'aka; Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.
22. Onye chọtaworo nwunye achọtawo ezi ihe, Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.
23. Okwu aririọ-amara di iche iche ka ob͕eye nēkwu: Ma ọgaranya nāza ike ike.
24. Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya: Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.
About Ilu Chapter 18
Read Ilu Chapter 18 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ilu
Chapter: 18
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ilu Chapter 18 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ilu Chapter 18?
Ilu Chapter 18 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ilu Chapter 18 online for free with easy chapter navigation.