Deuteronomi Chapter 7

For English

Read Deuteronomi Chapter 7 Online

Read Deuteronomi Chapter 7 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Deuteronomi in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Deuteronomi and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Deuteronomi 7

Isi 7

1. Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya, mb͕e Ọ gēwepu kwa ọtutu mba n'iru gi, bu ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, mba asa bara uba di kwa ike kari gi;

2. mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāra kwa ha nye n'iru gi, i we tib͕ue ha; i gēwezugasi kwa ha ka ebibie ha; gi na ha ab͕ala ndu, eme-kwa-la ha amara:

3. gi na ha alurita-kwa-la nwunye; enyela nwa-ya nwoke nwa-gi nwayi, ekuru-kwa-la nwa-ya nwayi nye nwa-gi nwoke.

4. N'ihi na ọ gēwezuga nwa-gi nwoke n'isom n'azu, ka ha we fè chi ọzọ: iwe Jehova gādi kwa ọku megide unu, Ọ gēkpochapu kwa gi ngwa ngwa.

5. Kama otú a ka unu gēme ha; unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia kwa ogidi nile ha, b͕utu kwa Asherim-ha, sure kwa arusi nile ha apiri api n'ọku.

6. N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi: ọ bu gi ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala.

7. Ọ bughi na unu bara uba kari ndi nile ka Jehova huru unu n'anya si-ike, we rọputa unu; n'ihi na unu onwe-unu di ole-na-ole kari ndi nile ọzọ:

8. kama ọ bu n'ihi na Jehova huru unu n'anya, na n'ihi na O debere iyi Ọ ṅuru nna-unu-hà, ka Jehova were aka di ike me ka unu puta, O we b͕aputa unu n'ulo ndi-orù, n'aka Fero, bú eze Ijipt.

9. I gāmara kwa na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu Chineke; Chineke ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, nēdebere ndi huru Ya n'anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya rue nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri;

10. Ọ nākwughachi kwa ndi nākpo Ya asì n'iru ha, ime ka ha la n'iyì: Ọ gaghi-alara onye nākpọ Ya asì azu, n'iru ya ka Ọ gākwughachi ya.

11. I gēdebe kwa ihe ahu enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ha.

12. Ọ gēru kwa, n'ihi na unu nānu ikpé ndia, debe kwa ha, me kwa ha, na Jehova, bú Chineke-gi, gēdebe-kwa-ra gi ọb͕ub͕a-ndu ahu na ebere ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha:

13. Ọ gāhu kwa gi n'anya, gọzie gi, me ka i ba uba: Ọ gāgọzi kwa nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-gi, bú ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, n'elu ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.

14. Ndi agọziri agọzi ka i gābu kari ndi nile ọzọ: nwoke nēnweghi ike imu nwa na nwayi-àgà agaghi-adi n'etiti gi, ma-ọbu n'etiti anu-ulo-gi.

15. Jehova gēwezuga kwa n'aru-gi ọria nile; nriaria ọjọ nile nke Ijipt nke i maworo, Ọ gaghi-atukwasi kwa ha n'aru-gi, ma Ọ gētiye ha n'aru ndi nākpọ gi asì.

16. I gēripia kwa ndi ahu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi; anya-gi agaghi-emere ha ebere: efè-kwa-la chi-ha di iche iche òfùfè; n'ihi na ọnyà ka ọ gāburu gi.

17. Mb͕e i gāsi n'obi-gi, Mba ndia bara uba karim; #m'gēsi aṅa pu inapu ha ala-ha?

18. atula egwu ha: i gēcheta nke-ọma ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Fero, me kwa Ijipt nile;

19. ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, na ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube nile, na aka ahu di ike, na ogwe-aka ahu esetiri eseti, nke Jehova, bú Chineke-gi, ji me ka i puta: otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, gēme ndi ahu nile ndi gi onwe-gi nātu egwu ha.

20. Ọzọ kwa, ọ bu ebu ka Jehova, bú Chineke-gi, gēsì n'etiti ha, rue mb͕e ndi fọduru, ndi nēzopu kwa onwe-ha n'iru gi, gāla n'iyì.

21. Amala jijiji n'iru ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu Chineke uku, di kwa egwu.

22. Ma Jehova, bú Chineke-gi, gēwepu mba ahu n'iru-gi nke-ntà nke-ntà: i pughi ime ka ha gwusia ngwa ngwa, ka anu-ọhia ghara iba uba megide gi.

23. Ma Jehova, bú Chineke-gi, gāra ha nye n'iru gi, me kwa ka ha b͕a aghara uku, rue mb͕e agēkpochapu ha.

24. Ọ gēnye kwa ndi-eze-ha n'aka-gi, i gēme kwa ka aha-ha lapu n'iyì n'okpuru elu-igwe: ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi, rue mb͕e i gēkpochapu ha.

25. Unu gēsure arusi nile apiri api nke chi nile ha n'ọku: enwela anya-uku n'ọla-ọcha na ọla-edo nke di n'aru ha, ewe-kwa-la n'onwe-gi, ka aghara ima gi n'ọnyà nime ya: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu:

26. eme-kwa-la ka ihe-árú ba n'ulo-gi, i we ghọ ihe ewezugara ka ebibie ya dika ya: i gājusi ya aju, kpọ kwa ya ihe rusiri árú; n'ihi na ihe ewezugara ka ebibie ya ka ọ bu.

About Deuteronomi Chapter 7

Read Deuteronomi Chapter 7 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Deuteronomi in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Deuteronomi
Chapter: 7
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Deuteronomi. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Deuteronomi Chapter 7 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Deuteronomi Chapter 7?

Deuteronomi Chapter 7 is part of the Book of Deuteronomi in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Deuteronomi Chapter 7 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Deuteronomi

  1. Deuteronomi Chapter 1
  2. Deuteronomi Chapter 23
  3. Deuteronomi Chapter 20
  4. Deuteronomi Chapter 14
  5. Deuteronomi Chapter 25
  6. Deuteronomi Chapter 5
  7. Deuteronomi Chapter 12

Related Chapters & Readings

  1. I. Samuel Chapter 18
  2. Aisaia Chapter 24
  3. Joshua Chapter 14
  4. I. Samuel Chapter 16
  5. Ndi-Hibru Chapter 13
  6. Ọpupu Chapter 27
  7. I. Ndi Tesalọnaika Chapter 2
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *