Levitikọs Chapter 9

For English

Read Levitikọs Chapter 9 Online

Read Levitikọs Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Levitikọs in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Levitikọs and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Levitikọs 9

Isi 9

1. O rue, n'ubọchi nke-asatọ, na Moses kpọrọ Eron na umu-ya ndikom, na ndi-okenye Israel;

2. ọ si Eron, Were n'onwe-gi nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nmehie, na ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku, nke zuru okè ka ha gābu, gi weta kwa ha nso n'iru Jehova.

3. Umu Israel ka i gāgwa kwa okwu, si, Werenu nkpi ka ọ buru àjà-nmehie; na nwa-ehi na nwa-aturu, ha abua gāb͕a otù arọ, bú nke zuru okè, ka ha buru àjà-nsure-ọku;

4. chiri kwa ehi na ebulu ka ha buru àjà-udo, ichu n'iru Jehova; were kwa onyinye-inata-iru-ọma agwara manu: n'ihi na ta ka Jehova gēme ka unu hu Ya anya.

5. Ha we weta ihe Moses nyere n'iwu n'iru ulo-ikwū nzute: nzukọ Israel nile we biaru nso guzo kwa n'iru Jehova.

6. Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka unu me: agēme kwa ka unu hu ebube Jehova anya.

7. Moses we si Eron, Biarue ebe-ichu-àjà nso, me àjà-nmehie-gi, na àjà-nsure-ọku-gi, kpuchiere onwe-gi, kpuchi-kwa-ra ndi Israel, nmehie-unu; me kwa onyinye iji biaru nso nke ndi ahu, kpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha; dika Jehova nyere iwu.

8. Eron we biarue ebe-ichu-àjà nso, b͕ue nwa-ehi nke àjà-nmehie nke diri ya onwe-ya.

9. Umu-ndikom Eron we wetara ya nso ọbara-ya: ọ we deye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà, we wusi ọbara na ntọ-ala ebe-ichu-àjà:

10. ma abuba, na akọrọ abua, na mba-imeju nke putara n'imeju, nke si n'àjà-nmehie puta, o surere ha ọku ibu ihe-nsure ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.

11. Ma anu-ya na akpukpọ-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū.

12. Ọ we b͕ue ihe àjà-nsure-ọku: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.

13. Àjà-nsure-ọku ka ha me-kwa-ra ka o rue ya aka, n'ọbubọ, na isi-ya; ọ we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà.

14. Ọ we sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà.

15. Ọ we weta nso onyinye iji biaru nso nke ndi Israel, were nkpi nke àjà-nmehie nke diri ndi ahu, b͕ue ya, chua ya n'àjà bayere nmehie, dika nke-mbu.

16. Ọ weta kwa àjà-nsure-ọku nso, me ya dika ikpé bayere ya si di.

17. Ọ weta kwa nso onyinye-inata-iru-ọma, si nime ya meju ọbu-aka-ya, sure ya ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà, tiyere àjà-nsure-ọku nke ututu.

18. O b͕u-kwa-ra ehi ahu na ebulu ahu, bú ihe àjà nke àjà-udo, nke diri ndi Israel: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu,

19. ha me-kwa-ra ka abuba nile nke putara n'ehi ahu rue ya aka; na ihe putara n'ebulu ahu, bú akuku ọdudu nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na akọrọ abua, na mba-imeju nke imeju:

20. ha we tukwasi abuba ahu n'okpukpu-obi, ọ we sure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'ebe-ichu-àjà:

21. ma okpukpu-obi-ha na utaku-ukwu aka-nri ka Eron fere ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova; dika Moses nyere iwu.

22. Eron we chilie aka-ya n'ebe ndi Israel nọ, gọzie ha; o si n'ime àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku na àjà-udo rida.

23. Moses na Eron we ba n'ulo-ikwū nzute, puta kwa, gọzie ndi Israel: ewe me ka ndi ahu nile hu ebube Jehova anya.

24. Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n'elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n'ala.

About Levitikọs Chapter 9

Read Levitikọs Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Levitikọs in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Levitikọs
Chapter: 9
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Levitikọs. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Levitikọs Chapter 9 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Levitikọs Chapter 9?

Levitikọs Chapter 9 is part of the Book of Levitikọs in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Levitikọs Chapter 9 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Eklisiastis Chapter 2

Explore More from levitikọs

  1. Levitikọs Chapter 15
  2. Levitikọs Chapter 4
  3. Levitikọs Chapter 18
  4. Levitikọs Chapter 26
  5. Levitikọs Chapter 12
  6. Levitikọs Chapter 25
  7. Levitikọs Chapter 10

Related Chapters & Readings

  1. Ọpupu Chapter 25
  2. II. Ihe Emere Chapter 30
  3. Matiu Chapter 10
  4. Luk Chapter 19
  5. II. Ihe Emere Chapter 7
  6. Jọn Chapter 10
  7. I. Ihe Emere Chapter 18
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *