Ọlu Ndi-Ozi Chapter 28

For English

Read Ọlu Ndi-Ozi Chapter 28 Online

Read Ọlu Ndi-Ozi Chapter 28 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọlu Ndi-Ozi in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọlu Ndi-Ozi and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ọlu Ndi-Ozi 28

Isi 28

1. Mb͕e azọputasiri ayi, mb͕e ahu ayi matara na anākpọ agwe-etiti ahu Melita.

2. Ndi bi n'ebe ahu, bú ndi nāsu asusu ọzọ, we were obi-ọma mezie ayi n'uzọ anāhughi mb͕e ọ bula: n'ihi na ha funwuru ọku, kpọbata ayi nile, n'ihi miri nke nēzo n'oge ahu, na n'ihi oyi.

3. Ma mb͕e Pọl chikọtasiri ùkwù nkù, tukwasi ha n'ọku, aju-ala we si n'okpom-ọku ahu puta, ta ya alu kokwasi kwa ya n'aka.

4. Mb͕e ndi ahu ndi nāsu asusu ọzọ huru anu-ọhia ahu ka o kokwasiri ya n'aka, ha we sirita ibe-ha, N'ezie nwoke a bu ob͕u-madu, onye ọ bu ezie na azọputara ya n'oké osimiri, ma Ikpé ziri ezi ekweghi ka ọ di ndu.

5. Otú ọ di, o febàra anu-ọhia ahu nime ọku, ma ọ dighi ihe ọjọ meruru ya aru.

6. Ma ha nēle anya na ọ gaje iza, ma-ọbu ida n'ala nwua na mberede: ma mb͕e ha nēle anya ogologo oge, ma ha ahughi ihe ọ bula jọrọ njọ mere ya, ha we chègharia uche-ha, si na ọ bu chi.

7. Ma n'ala di ab͕ata ebe ahu onye-isi agwe-etiti ahu, aha-ya bu Pọbliọs, nwere iberibe ala ufọdu; onye nara ayi nke-ọma, were kwa obi-ọma le ayi ọbìa ubọchi atọ.

8. O we rue, na nna Pọbliọs nēdina, aru-ọku na ọnyunyu-ọbara jidesiri ya ike: onye Pọl bakutere, we kpe ekpere, bikwasi ya aka abua me ka aru di ya ike.

9. Mb͕e emere nka, ndi fọduru n'agwe-etiti ahu ndi nāria nriaria we biakute ya, ewe me ka aru-ha di ike:

10. ha we were kwa ọtutu nsọpuru sọpuru ayi; mb͕e ayi nupuru ub͕ọ, ha we tiye n'ub͕ọ ihe nile di ayi nkpà.

11. Mb͕e ọnwa atọ gasiri ayi we ba n'ub͕ọ Aleksandria nupu, bú ub͕ọ nke nọgidereri n'agwe-etiti ahu na mb͕e oyi, nke ihe-iriba-ama-ya bu, Umu-nne-ndikom abua amuru n'otù mb͕e.

12. Ayi we rue ala na Sairakus, we nọgide n'ebe ahu ubọchi atọ.

13. Ayi we site n'ebe ahu ga buruburu, we rue Rijiọm: mb͕e otù ubọchi gasiri ifufe Ndida we febe, n'ubọchi nke-abua ayi we bia rue Pọtiọli:

14. ebe ayi huru umu-nna nime Kraist, ewe riọ ayi ka ayi na ha nọgide ubọchi asa: otú a ayi we bia rue Rom.

15. Umu-nna-ayi nime Kraist, mb͕e ha nuru ihe bayere ayi, ha we bia izute ayi rue Ahia Apiọs, na Ulo-ndi-ije Atọ: mb͕e Pọl huru ha, o kele Chineke, nwe kwa obi-ike.

16. Mb͕e ayi batara nime Rom, ewe kwe ka Pọl nọgide iche, ya na onye-agha nke nēche ya.

17. O rue, na mb͕e ubọchi atọ gasiri ọ kpọkọrọ ndi bu ndi-isi n'etiti ndi-Ju: mb͕e ha biakọrọ n'otù, ọ si ha, Umu-nnem, mu onwem, ọ bu ezie na emeghm ihe ọ bula megide ndi-Ju, ma-ọbu ọme-n'ala nke nna-ayi-hà, ma esi na Jerusalem raram nye n'aka ndi Rom ka m'buru onye-nkpọrọ:

18. ma ndi ahu, mb͕e ha kpesirim ikpé, ha zubere irapum ka m'la, n'ihi na ọ dighi ihe kwesiri onwu dim n'aru.

19. Ma mb͕e ndi-Ju kwugidere ya, erugiderem ka m'kpọkue Sisa; ọ bughi na enwerem ihe ibo mba nkem ebubo.

20. Ya mere n'ihi ihe nka ka m'riọrọ unu ka m'hu unu anya gwa kwa unu okwu: n'ihi na ọ bu n'ihi olile-anya nke Israel ka ekerem nkpọrọ a

21. Ha we si ya, Ayi onwe-ayi anataghi akwukwọ-ozi site na Judia bayere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula n'etiti umu-nne-ayi ruru ebe a, we kọ akukọ ma-ọbu kwue ajọ ihe ọ bula bayere gi.

22. Ma ọ di ayi nma inu n'ọnu-gi ihe i tukwasiri uche-gi na ha: n'ihi na ihe bayere irọ-òtù a, ayi mazuru na anēkwugide ya ebe nile.

23. Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n'ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n'ihe bayere Jisus, site n'iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n'ututu rue anyasi.

24. Ufọdu we kwere ihe nile ekwuru, ma ufọdu ekweghi.

25. Mb͕e ha nēnweghi otù olu n'etiti onwe-ha, ha we la, mb͕e Pọl kwusiri otù okwu, si, Mọ Nsọ we site n'ọnu Aisaia onye-amuma gwa nna-unu-hà okwu nke-ọma,

26. si, Jekuru ndi nka, si, N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli; N'ọhuhu unu gāhu, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:

27. N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.

28. Ya mere maranu, na nzọputa nka, bú nke Chineke, ka ezigara ndi mba ọzọ: ndi ahu gānu kwa.

29. Mgbe o kwusiri okwu ndia, ndi-Ju we pua, rurita uka nke-uku n'etiti onwe-ha.

30. O we nọgide arọ abua dum n'ulo nke aka ya o goro ego, nānara kwa ndi nile bakutere ya,

31. nēkwusa ala-eze Chineke, nēwere kwa nkwuwa-okwu nile zí ihe nile bayere Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ọ dighi onye nēb͕ochi ya.

About Ọlu Ndi-Ozi Chapter 28

Read Ọlu Ndi-Ozi Chapter 28 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọlu Ndi-Ozi in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ọlu Ndi-Ozi
Chapter: 28
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọlu Ndi-Ozi. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ọlu Ndi-Ozi Chapter 28 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ọlu Ndi-Ozi Chapter 28?

Ọlu Ndi-Ozi Chapter 28 is part of the Book of Ọlu Ndi-Ozi in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ọlu Ndi-Ozi Chapter 28 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from ọlu-ndi-ozi

  1. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 10
  2. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 2
  3. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 9
  4. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 6
  5. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 21
  6. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 8
  7. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 26

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 24
  2. Maika Chapter 2
  3. I. Ihe Emere Chapter 27
  4. Abù Ọma Chapter 80
  5. II. Samuel Chapter 4
  6. Abù Ọma Chapter 56
  7. Maika Chapter 4
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *