Abù Nke Abù Chapter 4

For English

Read Abù Nke Abù Chapter 4 Online

Read Abù Nke Abù Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Nke Abù in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Nke Abù and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Abù Nke Abù 4

Isi 4

1. Le, i mara nma, eyìm, le, i mara nma; Anya-gi abua di ka nduru n'azu ákwà-nkpuchi-gi: Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu, Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead.

2. Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu nke akpachaworo aji-ha ọhu, Nke siworo n'isa-aru rigota; Nke ha nile chi umu abua umu abua, Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha.

3. Dika ogho uhie ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua bu, Okwu-ọnu-gi ma-kwa-ra nma: Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi bu N'azu ákwà-nkpuchi-gi.

4. Dika ulo-elu Devid, nke ewuru idebe ihe-agha, otú a ka olu-gi di, Nke ekobeworo nnù ọta abua na ọgu iri, Bú ọta ntà nile nke ndi-dike.

5. Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru, Nke nāta nri n'etiti urodi.

6. Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa, Mu onwem gēje n'ugwu myrrh, Na n'ugwu ntà frankincense.

7. I mazuru nma, eyìm; Ọ dighi kwa ntupọ di n'aru-gi.

8. Si na Lebanon som, nwunye ọhu nkem, Si na Lebanon som: Site n'elu Amana le anya, Site n'elu Senia na Heamon, Site n'ebe-obibi nile nke ọdum. Site n'ugwu nile nke agu.

9. I riwo obim, nwa-nnem nwayi; I werewo otù nime anya-gi abua, I werewo kwa otù ihe-inya-n'olu site n'olu-gi, rie obim.

10. Le ka ihu-n'anya-gi nile si ma nma nke-uku, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem! Le ka ihu-n'anya-gi nile si di nma nke-uku kari manya-vine! Le kwa ka ísì utọ nke manu-gi nile di nma nke-uku kari uda nile!

11. Manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu abusi ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nābusi, nwunye ọhu nkem: Manu-aṅu na miri-ara-ehi di n'okpuru ire-gi; Ísì utọ nke uwe-gi nile di kwa ka ísì utọ Lebanon.

12. Ubi ab͕ara ogige nke akpachiri akpachi ka nwa-nnem nwayi, bú nwunye ọhu nkem, bu; Ebe-nsuputa-miri akpachiri akpachi, isi-iyi ab͕achiri ab͕achi.

13. Ome-gi nile bu ogige ọma nke pome-granate, nwere nkpuru di iche iche di oké ọnu-ahia; Henna, ya na osisi manu nard nile,

14. Manu nard na saffron, Calamus na cinnamon, ha na osisi nile nke frankincense; Myrrh na aloes, ha na isi uda nile.

15. Isi-iyi nke ubi nile ab͕ara ogige ka i bu, Olùlù-miri nke juputara na miri di ndu, Na miri-iyi di iche iche nke nērù erù site na Lebanon.

16. Teta, gi ifufe Ugwu; bia kwa, gi ifufe Ndida; Fekwasi ubim ab͕ara ogige, ka uda-ya di iche iche we rùpu. Ka onye ihe-ya nātọm utọ bata n'ubi-ya ab͕ara ogige, We rie nkpuru-ya di iche iche nke di oké ọnu-ahia.

About Abù Nke Abù Chapter 4

Read Abù Nke Abù Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Nke Abù in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Abù Nke Abù
Chapter: 4
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Nke Abù. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Abù Nke Abù Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Abù Nke Abù Chapter 4?

Abù Nke Abù Chapter 4 is part of the Book of Abù Nke Abù in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Abù Nke Abù Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from abù-nke-abù

  1. Abù Nke Abù Chapter 2
  2. Abù Nke Abù Chapter 3
  3. Abù Nke Abù Chapter 7
  4. Abù Nke Abù Chapter 6
  5. Abù Nke Abù Chapter 8
  6. Abù Nke Abù Chapter 1
  7. Abù Nke Abù Chapter 5

Explore More from Agba Ochie

  1. Abù Ọma Chapter 130
  2. Nehemaia Chapter 9
  3. II. Ihe Emere Chapter 26
  4. Jenesis Chapter 12
  5. Joshua Chapter 12
  6. II. Ndi-Eze Chapter 3
  7. Ilu Chapter 8

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 60
  2. Jọn Chapter 16
  3. Matiu Chapter 20
  4. Ezikiel Chapter 43
  5. Ezikiel Chapter 16
  6. Nehemaia Chapter 8
  7. Ezikiel Chapter 37
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *