Ọnu-Ọgugu Chapter 25

For English

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 25 Online

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 25 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọnu-Ọgugu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ọnu-Ọgugu 25

Isi 25

1. Israel we biri na Shitim, ndi Israel we malite isoro umu-ndinyom Moab nākwa iko:

2. ndinyom ahu we kpọ ndi Israel ibia n'àjà chi nile ha; ndi Israel we rie ihe, kpọ isi ala nye chi nile ha.

3. Israel we kekọta onwe-ya n'aru Beal-peoa: iwe Jehova we di ọku megide Israel.

4. Jehova we si Moses, Chiri ndi-isi nile nke ndim, kpọgidere ha Jehova n'iru anyanwu, ka idi-ọku nke iwe Jehova we si n'aru Israel laghachi.

5. Moses we si ndi-ikpé Israel, B͕uenu, onye ọ bula ya b͕ue ndikom-ya ndi nēkekọta onwe-ha n'aru Beal-peoa.

6. Ma, le, otù nwoke nime umu Israel biara, weta nso umu-nne-ya otù nwayi Midian n'anya Moses, na n'anya nzukọ nile nke umu Israel, mb͕e ha onwe ha nākwa ákwá n'ọnu-uzọ ulo-kwū nzute.

7. Finehas, nwa-nwoke Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, we hu ya, o we si n'etiti nzukọ Israel bilie, were ube n'aka-ya,

8. soro nwoke Israel ahu ba nime ulo-ndina-ya, mapue ha abua, bú nwoke Israel ahu, na nwayi ahu rue ime-afọ-ya. Ewe b͕ochie ihe otiti ahu n'aru umu Israel.

9. Ma ndi nwuru n'ihe-otiti ahu di orú nnù uzọ atọ.

10. Jehova we gwa Moses okwu, si,

11. Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, emewo ka ọnumam si n'aru umu Israel laghachi, n'iwere ekworom kwo ekworo n'etiti ha, M'we ghara ime ka umu Israel gwusia n'ekworom.

12. N'ihi ya si ya, Le, anamenye ya ọb͕ub͕a-ndum nke udo:

13. ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya, ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi; n'ihi na o kworo ekworo bayere Chineke-ya, kpuchi-kwa-ra umu Israel nmehie-ha.

14. Ma aha nwoke Israel ahu nke etib͕uru etib͕u, onye etib͕uru ya na nwayi Midian, bu Zimri, nwa Salu, bú onye-isi nke otú ulo nna nke ndi Simeon.

15. Aha nwayi Midian ahu nke etib͕uru etib͕u bu Kọzbi, nwa Zua; onye-isi mba nke otù ulo nna na Midian ka ọ bu.

16. Jehova we gwa Moses okwu, si,

17. Kpab͕ue ndi Midian, tib͕u kwa ha:

18. n'ihi na ha nākpab͕u unu n'aghughọ nile ha, nke ha ji ghọb͕u unu n'okwu Peoa, na n'okwu kọzbi, bú nwa-nwayi onye-isi Midian, nwa-nne-ha nwayi, nke etib͕uru n'ubọchi ihe-otiti ahu n'okwu Peoa.

About Ọnu-Ọgugu Chapter 25

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 25 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ọnu-Ọgugu
Chapter: 25
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọnu-Ọgugu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ọnu-Ọgugu Chapter 25 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ọnu-Ọgugu Chapter 25?

Ọnu-Ọgugu Chapter 25 is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ọnu-Ọgugu Chapter 25 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from ọnu ọgugu

  1. Ọnu-Ọgugu Chapter 21
  2. Ọnu-Ọgugu Chapter 35
  3. Ọnu-Ọgugu Chapter 3
  4. Ọnu-Ọgugu Chapter 20
  5. Ọnu-Ọgugu Chapter 19
  6. Ọnu-Ọgugu Chapter 18
  7. Ọnu-Ọgugu Chapter 6

Related Chapters & Readings

  1. Ọpupu Chapter 25
  2. II. Ihe Emere Chapter 1
  3. Abù Ọma Chapter 72
  4. Abù Ọma Chapter 15
  5. Mak Chapter 15
  6. Nkpugh Chapter 2
  7. Abù Ọma Chapter 59
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *