II. Ihe Emere Chapter 34

For English

Read II. Ihe Emere Chapter 34 Online

Read II. Ihe Emere Chapter 34 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ihe Emere in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ihe Emere and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

II. Ihe Emere 34

Isi 34

1. Josaia b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iri na otù nime Jerusalem.

2. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.

3. Ma n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ya onwe-ya nọ na nwata, ọ malitere ichọ Chineke nke Devid nna-ya: n'arọ nke-iri-na-abua ka ọ malite-kwa-ra ime Juda na Jerusalem ka ha di ọcha pua n'ebe di elu nile, na Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu.

4. Ha we kwatue ebe-ichu-àjà Bealim n'iru ya; o b͕utue arusi-anyanwu nile, nke di n'ebe di elu n'elu ugwu; o tipia-kwa-ra Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu, ọ supia ha, fesa n'elu ílì ndi nāchuru ha àjà.

5. O sure ọkpukpu nke ndi-nchu-àjà n'elu ebe-ichu-àjà-ha, me ka Juda na Jerusalem di ọcha.

6. O me-kwa-ra otú a n'obodo nile nke Manase na Efraim na Simeon, we rue Naftali, nime nkpọnkpọ-ebe-ha nile buruburu.

7. Ọ kwatue ebe-ichu-àjà nile, tipia Asherim na arusi nile apiri api, ha we ghọ uzuzu, o b͕utu-kwa-ra arusi-anyanwu nile n'ala Israel nile, we lata na Jerusalem.

8. Ma n'arọ nke-iri-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ọ mesiri ka ala-ya na ulo ahu di ọcha, o zigara Shefan nwa Azalia, na Maaseia, bú onye-isi obodo ahu, na Joa nwa Joahaz, bú onye-ncheta, ime ulo Jehova, bú Chineke, ka ọ di ike.

9. Ha we biakute Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, nye ya ego ahu nke anēwebata n'ulo Chineke, nke ndi Livai, bú ndi nēche nbata-uzọ, chikọtara n'aka ndi Manase na Efraim, na n'aka ndi nile fọduru nke Israel, na n'aka Juda na Benjamin nile na ndi bi na Jerusalem.

10. Ha we nye ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n'ulo Jehova; ndi nēje ozi ahu, bú ndi nālu ọlu n'ulo Jehova, we nye ya iji mezi ebe etipúru etipú na ime ka ulo ahu di ike;

11. ha we nye ya ndi-ọ̀kà n'osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, iji zuta nkume awara awa, na osisi iji me ihe-njikọta, na ijikọta ulo nile nke ndi-eze Juda bibiri.

12. Ndikom ahu nālu ọlu n'ikwesi-ntukwasi-obi n'ozi ahu: ndi-nlekọta-ha bu kwa Jahat na Obadaia, ndi Livai, ndi sitere n'umu Merari; na Zekaraia na Meshulam, ndi sitere n'umu ndi Kohat, ibu ndi-isi: na ndi Livai ọzọ, bú ndi nile nwere nghọta n'ihe abù.

13. Ha bu kwa ndi-isi nke ndi-ibu, ha nēdu kwa ndi nile nēje ozi ifè òfùfè ọ bula: ufọdu nime ndi Livai bu kwa ndi-ode-akwukwọ, na ndi-odozi-okwu, na ndi-ọnu-ama.

14. Ma mb͕e ha nēweputa ego ahu nke anēwebata n'ulo Jehova, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara akwukwọ iwu Jehova nke enyere site n'aka Moses.

15. Hilkaia we za, si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n'ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu.

16. Shefan we būru akwukwọ ahu biakute eze, ọzọ kwa, o weghachiri eze okwu, si, Ihe nile enyere n'aka ndi-orù-gi, ha nēme ya.

17. Ha awupuwo kwa ego nke anāchọta n'ulo Jehova, ha we nye ya n'aka ndi-nlekọta ahu, na n'aka ndi nēje ozi ahu.

18. Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n'iru eze.

19. O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile.

20. Eze we nye Hilkaia, na Ahaikam nwa Shefan, na Abdon nwa Maika, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,

21. Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi fọduru n'Israel na nime Juda, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke awusaworo ayi, n'ihi na nna-ayi-hà edebeghi okwu Jehova, ime dika ihe nile si di nke edeworo n'akwukwọ a.

22. Hilkaia, na ndi ahu eze gwara, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tokhat, nwa Hasra, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n'obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu otú a.

23. Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem,

24. Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú nkọcha nile nke edeworo n'akwukwọ ahu nke ha guworo n'iru eze Juda:

25. n'ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe wusa ọnumam n'ebe a, agaghi-emenyu kwa ya.

26. Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo,

27. n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Chineke, mb͕e i nuru okwu-Ya nile megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, i we ruru ala n'irum, dọwa kwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

28. Le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ, agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya. Ha we weghachiri eze okwu.

29. Eze we ziga, chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem.

30. Eze we rigorue ulo Jehova, ya na ndikom nile nke Juda, na ndi bi na Jerusalem, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi Juda nile, site n'onye uku we rue onye ntà; o we gua na nti-ha okwu nile nke akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu nke achọtaworo n'ulo Jehova.

31. Eze we guzo n'ọnọdu-ya, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a.

32. O we me onye ọ bula ahuru na Jerusalem na Benjamin ka o guzo. Ndi bi na Jerusalem we me dika ọb͕ub͕a-ndu Chineke si di, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

33. Josaia we si n'ala nile nke umu Israel nwere wezuga ihe-árú nile, me ndi nile ahuru n'Israel ka ha fè òfùfè, ọbuná ifè Jehova, bú Chineke-ha, òfùfè. Ubọchi-ya nile ha esighi n'iso Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, wezuga onwe-ha.

About II. Ihe Emere Chapter 34

Read II. Ihe Emere Chapter 34 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ihe Emere in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: II. Ihe Emere
Chapter: 34
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ihe Emere. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading II. Ihe Emere Chapter 34 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is II. Ihe Emere Chapter 34?

II. Ihe Emere Chapter 34 is part of the Book of II. Ihe Emere in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete II. Ihe Emere Chapter 34 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 7
  6. Esta Chapter 4
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from ii ihe emere

  1. II. Ihe Emere Chapter 16
  2. II. Ihe Emere Chapter 6
  3. II. Ihe Emere Chapter 25
  4. II. Ihe Emere Chapter 4
  5. II. Ihe Emere Chapter 24
  6. II. Ihe Emere Chapter 19
  7. II. Ihe Emere Chapter 7

Related Chapters & Readings

  1. II. Ndi-Eze Chapter 10
  2. I. Ihe Emere Chapter 5
  3. I. Ihe Emere Chapter 23
  4. Levitikọs Chapter 22
  5. Abù Ọma Chapter 129
  6. Ezikiel Chapter 46
  7. Abù Ọma Chapter 55
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *