Read Jeremaia Chapter 40 Online
Read Jeremaia Chapter 40 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jeremaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jeremaia and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Jeremaia 40
Isi 40
1. Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, zilagasiri ya site na Rema, ka o weresiri ya mb͕e ọ bu onye ejiri nkpọrọ ke ab͕u n'etiti ndi Jerusalem na Juda nile ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi emere ka ha je biri na Babilon.
2. Onye-isi ndi-ob͕ū we were Jeremaia, si ya, Jehova, bú Chineke-gi, kwuru ihe ọjọ a megide ebe a:
3. Jehova we me ka ọ bia, O we me dika O kwuru; n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, ma unu egeghi nti olu-Ya, n'ihi nka ka ihe a ruworo unu aru.
4. Ma ub͕u a, le, atọpuwom i ta na nkpọrọ nke di n'aka-gi. Ọ buru na ọ di nma a'anya-gi isorom bia na Babilon, bia, anyam gādi kwa a'aru gi; ma ọ buru na ọ jọrọ njọ n'anya-gi isorom bia na Babilon, ghara: le, ala nka nile di n'iru gi; n'ebe di nma na n'ebe ziri ezi n'anya-gi ije, je n'ebe ahu.
5. Ma mb͕e ọ kālaghachighi, ọ si ya, Ma-ọbu laghachikuru Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye eze Babilon meworo onye-nlekọta obodo nile nke Juda, gi na ya biri n'etiti ndi-gi: ma-ọbu je ebe ọ bula ziri ezi n'anya-gi ije. Onye-isi ndi-ob͕ū we nye ya òkè ihe-oriri na onyinye, zilaga ya.
6. Jeremaia we biakute Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa, ya na ya we biri n'etiti ndi Israel ndi fọduru n'ala-ha.
7. Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta n'ala-ha, na o me-kwa-ra ya onye-nlekọta nke ndikom na ndinyom na umu-ntakiri, bú ufọdu nime ndi nēnweghi ike n'ala, nime ndi anēmeghi ka ha je biri na Babilon;
8. ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan na Jonatan, bú umu Karea, na Seraia nwa Tanhumet, na umu Efai, bú onye Netofa, Jezanaia nwa onye Meaka, ha onwe-ha na ndikom-ha.
9. Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si, Unu atula egwu ifè ndi Kaldea: birinu n'ala, fè kwa eze Babilon, ọ gādi-kwa-ra unu nma.
10. Ma mu onwem, le, m'ganēbi na Mizpa, iguzo n'iru ndi Kaldea, ndi gābiakute ayi: ma unu onwe-unu, chikọtanu manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru na manu, tiye ha n'ihe-unu, biri-kwa-nu n'obodo nile unu nke unu wereworo.
11. Ọzọ kwa, ndi-Ju nile ndi nọ na Moab, na n'etiti umu Amon, na n'Edom, na ndi nọ n'ala nile, nuru na eze Babilon enyewo Juda ndi fọduru, na o mewo kwa Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye-nlekọta-ha;
12. ndi-Ju nile we si n'ebe nile achugara ha-ri lata, we bata n'ala Juda, biakute Gedalaia, rue Mizpa, we chikọta manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru nke-uku.
13. Ọzọ, Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, biakutere Gedalaia rue Mizpa,
14. si ya, Ì mara n'ezie na Bealis, bú eze umu Amon, ezitewo Ishmael nwa Netanaia itib͕u gi onwe-gi? Ma Gedalaia nwa Ahaikam ekweghi ihe ha kwuru.
15. Johanan nwa Karea we gwa Gedalaia okwu na nzuzo nime Mizpa, si, Biko, ka m'je, m'gētib͕u kwa Ishmael nwa Netanaia, ma ọ dighi onye ọ bula gāma: n'ihi gini ka o gētib͕u gi onwe-gi, Juda nile ewe b͕asa, bú ndi achikọtaworo n'ebe i nọ, ndi Juda fọduru ewe la n'iyì?
16. Gedalaia nwa Ahaikam we si Johanan nwa Karea, Emela ihe a: n'ihi na okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu bayere Ishmael.
About Jeremaia Chapter 40
Read Jeremaia Chapter 40 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jeremaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Jeremaia
Chapter: 40
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jeremaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Jeremaia Chapter 40 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Jeremaia Chapter 40?
Jeremaia Chapter 40 is part of the Book of Jeremaia in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Jeremaia Chapter 40 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Esta Chapter 1
- Aisaia Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Esta Chapter 5
- Esta Chapter 4
- Esta Chapter 7
- Job Chapter 33
Explore More from Jeremaia
- Jeremaia Chapter 2
- Jeremaia Chapter 20
- Jeremaia Chapter 8
- Jeremaia Chapter 24
- Jeremaia Chapter 32
- Jeremaia Chapter 13
- Jeremaia Chapter 39