Jọn Chapter 4

For English

Read Jọn Chapter 4 Online

Read Jọn Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jọn and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Jọn 4

Isi 4

1. Ya mere mb͕e Onye-nwe-ayi mara na ndi-Farisi nururi na Jisus nēme madu ka ha buru ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ nēme kwa ha baptism, kari Jọn,

2. (ọ bu ezie na Jisus onwe-ya emeghi baptism, kama ọ bu ndi nēso uzọ-Ya),

3. Ọ rapuru Judia, we je Galili ọzọ.

4. Ma Ọ ghaghi igabiga n'etiti Sameria.

5. Ya mere Ọ bia rue otù obodo nke Sameria, anākpọ Saika, na nso iberibe ala ahu nke Jekob nyere nwa-ya Josef:

6. ma isi-iyi Jekob di n'ebe ahu. Ya mere Jisus, ebe ike gwuru Ya n'ije-Ya, Ọ nọduru ala otú a n'usọ isi-iyi ahu. Ọ ra ka oge hour nke-isi.

7. Otù nwanyi, bú onye Sameria, bia isere miri: Jisus si ya, Nyem miri ka M'ṅua.

8. N'ihi na ndi nēso uzọ-Ya jeriri n'obodo izu nri.

9. Ya mere nwanyi Sameria ahu si Ya, Gì onwe-gi si aṅa ariọ miri n'akam ka I ṅua, ebe I bu Onye-Ju, ma mu bu nwanyi Sameria? (N'ihi na ndi-Ju na ndi Sameria adighi-emekọ ihe.)

10. Jisus zara, si ya, Ọ buru na i matara onyinye Chineke, na Onye Ọ bu Nke nāsi gi, Nyem miri ka M'ṅua; gi onwe-gi gāriọ Ya-ri, Ọ gēnye kwa gi miri di ndu.

11. Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, I nweghi ihe isere miri, ma olùlù-miri a di omimi: òle ebe kwa ka I nwere miri ahu di ndu?

12. Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Jekob uku, onye nyere ayi olùlù-miri a; ya onwe-ya, na umu-ya, na anu-ulo-ya, ṅu-kwa-ra nime ya?

13. Jisus zara, si ya, Onye ọ bula nke nāṅu miri a, akpiri gākpọ ya nku ọzọ:

14. ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi.

15. Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, nyem miri a, ka akpiri we ghara ikpọm nku, ka m'ghara kwa isi n'ogologo uzọ a nile bia ebe a isere miri.

16. Jisus si ya, Laba, kpọ di-gi, bia kwa n'ebe a.

17. Nwanyi ahu zara, si Ya, Enweghm di. Jisus si ya, I kwuru nke-ọma, si, Enweghi m di:

18. n'ihi na i nwewo di ise; ma onye i nwere ub͕u a abughi di-gi: nka ka i kwuworo n'ezie.

19. Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, ahurum na Gi onwe-gi bu onye-amuma.

20. Nna-ayi-hà nile kpọrọ isi ala nye Chineke n'ugwu a; ma unu onwe-unu si, na ebe madu aghaghi ikpọ isi ala nye Chineke di nime Jerusalem.

21. Jisus si ya, Nwanyi, kwerem, oge hour nābia, mb͕e unu nāgaghi-akpọ isi ala nye Nnam, ma ọ bu n'ugwu a, ma-ọbu na Jerusalem.

22. Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n'ihi na nzọputa si n'etiti ndi-Ju puta.

23. Ma oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nākpọ isi ala n'ezie gākpọ isi ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu: n'ihi na ndi di otú ahu ka Nnam nāchọ kwa ka ha buru ndi nākpọ isi ala nye Ya.

24. Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghaghi ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu.

25. Nwanyi ahu si Ya, Amataram na Mesaia nābia (Onye anākpọ Kraist): mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, Ọ gākọrọ ayi ihe nile.

26. Jisus si ya, Mu onwem Nke nāgwa gi okwu bu Ya.

27. Mb͕e Ọ nēkwu nka ndi nēso uzọ-Ya biara; o we ju ha anya na Ya na nwanyi nēkwurita okwu: otú ọ di, o nweghi onye ọ bula siri, Gini ka I nāchọ? ma-ọbu, Gini mere Gi na ya nēkwurita okwu?

28. Ya mere nwanyi ahu rapuru ite-miri-ya, we je ba nime obodo, si ndi ahu,

29. Bianu, le otù Nwoke, Onye gwaram ihe nile m'mere: Ònye a gābu Kraist ahu?

30. Ha siri n'obodo-ha puta, nābiakute kwa Ya.

31. Mb͕e ihe ndia nēme ndi nēso uzọ-Ya nāriọ Ya, si, Rabai, rie ihe.

32. Ma Ọ siri ha, Mu onwem nwere ihe-oriri iri nke unu onwe-unu nāmataghi.

33. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya sirita onwe-ha, Ọ̀ di onye wetara Ya ihe Ọ gēri?

34. Jisus si ha, Ihe-oririm bu ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'luzu kwa ọlu-Ya.

35. Ùnu onwe-unu asighi, Ọnwa anọ fọduru, owuwe-ihe-ubi ewe bia? le, asim unu, Welienu anya-unu elu, kiri ubi, na ha chara acha ub͕u a ka ewere ihe di nime ha.

36. Onye nēwere ihe ubi nānara ugwọ-ọlu-ya, nāchikọta kwa nkpuru nye na ndu ebighi-ebi; ka onye nāgha nkpuru na onye nēwere ihe ubi we ṅuria ọṅu n'otù.

37. N'ihi na nime nka ka okwu a bu ezie, Otù onye nāgha nkpuru, ma onye ọzọ nēwere ihe ubi.

38. Mu onwem zigara unu iwere ihe ubi nke ọ dighi mb͕e unu onwe-unu dọb͕uworo onwe-unu n'ilu ya: ndi ọzọ adọb͕uwo onwe-ha n'ọlu, unu onwe-unu abàwo kwa na ndọb͕u-ha.

39. Ma ọtutu ndi Sameria si n'obodo ahu kwere na Ya n'ihi okwu nwanyi ahu, onye b͕ara àmà, si, Ọ gwaram ihe nile m'mere.

40. Ya mere mb͕e ndi Sameria biakutere Ya, ha riọ Ya ka Ọ nọyere ha: O we nọgide n'ebe ahu ubọchi abua.

41. Ma ndi kwere n'ihi okwu-Ya kariri ri nne;

42. ha we si nwanyi ahu, Ọ bughi n'ihi ihe i kwuru ka ayi nēkwe ub͕u a: n'ihi na ayi onwe-ayi anuwo, mata kwa na Onye a bu Onye-nzọputa nke uwa n'ezie.

43. Ma mb͕e ubọchi abua ahu gasiri, O si n'ebe ahu pua ba na Galili.

44. N'ihi na Jisus onwe-ya b͕ara àmà, na adighi-asọpuru onye-amuma n'ala nke aka ya.

45. Ya mere mb͕e Ọ biara na Galili, ndi Galili nara Ya nke-ọma, ebe ha hururi ka ihe O mere na Jerusalem ra n'ememe: n'ihi na ha onwe-ha je-kwa-ra ememe ahu.

46. Ya mere Ọ biaruru Kena nke Galili ozọ, ebe O mere miri ka ọ ghọ manya-vine, Ma otù nwoke nke nējere eze ozi di, nke aru nādighi nwa-ya nwoke ike na Kapanaum.

47. Mb͕e onye ahu nuru na Jisus esiwo na Judia puta ba na Galili, o jekuru Ya, riọ Ya ka Ọ ridata, me ka aru di nwa-ya ike; n'ihi na ọ nọ n'ọnu ọnwu.

48. Ya mere Jisus siri ya, Ọ buru na unu ahughi ihe-iriba-ama na ọlu-ebube, unu agaghi-ekwe ma-ọli.

49. Nwoke ahu nke nējere eze ozi si Ya, Onye-nwe-ayi, ridata mb͕e nwatakirim akānwughi.

50. Jisus si ya, Ga nke gi; nwa-gi nwoke di ndu. Nwoke ahu kwere okwu Jisus gwara ya, o we ga nke ya.

51. Ma mb͕e ọ nọ nārida ub͕u a, ndi-orù-ya zutere ya, si, na nwa-ya di ndu.

52. Ya mere ọ juru ha oge hour nke aru-ya malitere idi ya nma. Ya mere ha siri ya, Nnyahuru n'oge hour nke-asa ka aru-ọku rapuru ya.

53. Ya mere nna-ya mara na ọ bu n'oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum.

54. Nka bu ihe-iriba-ama ọzọ nke mere ha abua nke Jisus mere, mb͕e O siri na Judia puta ba na Galili.

About Jọn Chapter 4

Read Jọn Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Jọn
Chapter: 4
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jọn. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Jọn Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Jọn Chapter 4?

Jọn Chapter 4 is part of the Book of Jọn in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Jọn Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from jọn

  1. Jọn Chapter 12
  2. Jọn Chapter 7
  3. Jọn Chapter 10
  4. Jọn Chapter 21
  5. Jọn Chapter 16
  6. Jọn Chapter 8
  7. Jọn Chapter 11

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 115
  2. I. Samuel Chapter 14
  3. Aisaia Chapter 51
  4. Zekaraia Chapter 2
  5. Ọnu-Ọgugu Chapter 36
  6. Abù Ọma Chapter 54
  7. Jeremaia Chapter 4
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *