Ndi-Hibru Chapter 9

For English

Read Ndi-Hibru Chapter 9 Online

Read Ndi-Hibru Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi-Hibru and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ndi-Hibru 9

Isi 9

1. Ya mere, ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu nwere ihe di iche iche aguru n'ihe ziri ezi n'ikpere Chineke, nwe kwa ebe nsọ ya, bú ebe nsọ nke uwa nka.

2. N'ihi na edoziri ulo-ikwū, ulo mbu, nke ihe-idọba-oriọna ahu, na table ahu, na ob͕e achicha ahu anēche n'iru Chineke di nime ya; nke anākpọ Ebe Nsọ.

3. Ma mb͕e agabigasiri ákwà-nb͕ochi nke-abua, ulo-ikwū nke anākpọ Ebe Nsọ kachasi ebe nsọ nile di;

4. nke nwere ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke amachitara ọla-edo gburugburu n'akuku nile, nke ite ọla-edo nke nwere manna di nime ya, ya na nkpa-n'aka ahu nke Eron nke mara ifuru, na mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu;

5. ma n'elu ya cherubim nke ebube di nēnye ebe anēme ka obi Chineke juru ǹdò; nke ayi nēnweghi ike ikwu okwu bayere ha n'otù n'otù ub͕u a.

6. Ma ebe edoziworo ihe ndia otú a, ndi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū mbu mb͕e nile, nēkpezu ekpere nile ha;

7. ma nání onye-isi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū nke-abua, nání otù mb͕e n'arọ, nāb͕aghi aka ọbara, nke ọ nēche n'iru Chineke n'ihi onwe-ya, na n'ihi amaghi-ama nile nke ndi Israel:

8. n'ihi na Mọ Nsọ nēgosi nka, na akēmeghi ka uzọ ibà n'ebe nsọ ahu puta ìhè, mb͕e ulo-ikwū mbu ahu nēguzogide ub͕u a:

9. bú ulo-ikwū nke bu ulọ aturu oge nke di ub͕u a; anēche kwa ma onyinye ma àjà n'iru Chineke dika ulo-ikwū ahu si di, bú ihe nāpughi ime onye nēkpe ekpere ka o zu okè n'akuku akọ-na-uche,

10. ebe ha bu nání (ha na ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na ime-baptism di iche iche) ihe di iche iche nke anu-aru aguru n'ihe ziri ezi, enyere n'iwu rue oge imezi ihe.

11. Ma Kraist, ebe Ọ biara ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà nke ezi ihe nile gaje ibia, O sitere n'ulo-ikwū ahu nke ka uku na nke zuru okè kari, ọ bughi nke eji aka me, nke isi-ya bu, ọ bughi nke òkìkè a,

12. O siteghi kwa n'ọbara nke ewu na nke umu-ehi, kama O sitere n'ọbara nke Ya onwe-ya, ba n'ebe nsọ nání otù mb͕e, ebe Ọ chọputara nb͕aputa ebighi-ebi.

13. N'ihi na asi na ọbara nke ewu na nke oke-ehi, na ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi, mb͕e ọ nēfesa ndi emeruworo emeru, nēdo madu nsọ ime ka anu-aru-ha di ọcha:

14. ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?

15. Ọ bu kwa n'ihi nka ka Ọ bu onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, ka ọ gābu, ebe otù Onye nwuru ib͕aputa madu n'aka njehie nile nke di n'okpuru ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu, ka ndi akpọworo we nata nkwa nke nketa ebighi-ebi ahu.

16. N'ihi na ebe ọb͕ub͕a-ndu di, ọ di nkpà ka ọnwu nke onye b͕ara ya di ya.

17. N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu nēguzosi ike n'elu ndi nwuru anwu: n'ihi na ò nwere uzọ ọ gābu ihe di ike mb͕e ọ bula onye b͕ara ya di ndu?

18. Ya mere emeghi ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu ọhu nējighi ọbara.

19. N'ihi na mb͕e Moses gwarari ndi Israel nile ihe nile ọ bula enyere n'iwu dika iwu ahu si di, ọ nara ọbara nke umu-ehi na ewu nile, ya na miri na aji-anu uhie na hyssop, we fesa akwukwọ ahu onwe-ya, na ndi Israel nile,

20. si, Nka bu ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke nyere unu n'iwu.

21. O we were ọbara ahu fesa kwa ulo-ikwū ahu na ihe nile nke ifè-òfùfè-ya otú ahu.

22. Ọ fọduru ihe ntà ka m'si na eji kwa ọbara eme ihe nile ka ha di ọcha, dika iwu-ayi si di, ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi.

23. Ya mere ọ di nkpà ka ewere ihe ndia me ka ihe-nṅomi nile nke ihe nile di n'elu-igwe di ọcha; ma ọ di nkpà ka ewere àjà ka ndia nma me ihe ahu onwe-ha nke di n'elu-igwe ka ha di ọcha.

24. N'ihi na Kraist abàghi n'ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n'ezie; kama Ọ bàra n'elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n'iru Chineke n'ihi ayi ub͕u a:

25. ọ bughi kwa ka O we nēche Onwe-ya n'iru Chineke ọtutu mb͕e; dika onye-isi-nchu-àjà nēwere ọbara nābughi nke ya nābà n'ebe nsọ kwa-arọ;

26. n'ihi na asi na ọ di otú a Ọ ghaghi ihu ahuhu ọtutu mb͕e site na ntọ-ala nke uwa: ma otú ọ di, ọ bu nání otù mb͕e nime nruzu nke oge ndia ka emeworo ka Ọ puta ìhè, ka O we site n'ichu Onwe-ya dika àjà me ka nmehie ghara idi irè.

27. Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya;

28. n'uzọ ra otú a Kraist, ebe echere Ya n'iru Chineke nání otù mb͕e iburu nmehie nile nke ọtutu madu, Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ub͕ò abua, ma nmehie adighi ya, ka ewe zọputa ha.

About Ndi-Hibru Chapter 9

Read Ndi-Hibru Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ndi-Hibru
Chapter: 9
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi-Hibru. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ndi-Hibru Chapter 9 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ndi-Hibru Chapter 9?

Ndi-Hibru Chapter 9 is part of the Book of Ndi-Hibru in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ndi-Hibru Chapter 9 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from ndi-hibru

  1. Ndi-Hibru Chapter 13
  2. Ndi-Hibru Chapter 3
  3. Ndi-Hibru Chapter 6
  4. Ndi-Hibru Chapter 8
  5. Ndi-Hibru Chapter 11
  6. Ndi-Hibru Chapter 4
  7. Ndi-Hibru Chapter 12

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 30
  2. Abù Ọma Chapter 92
  3. Aisaia Chapter 10
  4. Abù Ọma Chapter 3
  5. Jenesis Chapter 29
  6. Abù Ọma Chapter 85
  7. Ọpupu Chapter 9
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *