Read Ezikiel Chapter 5 Online
Read Ezikiel Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezikiel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ezikiel and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ezikiel 5
Isi 5
1. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n'onwe-gi mma-agha di nkọ, dika aguba nke ndi nākọpu isi ka i gēwere ya n'onwe-gi, i gēme kwa ka ọ gabiga n'isi-gi na n'afu-ọnu-gi: i gēwere kwa n'onwe-gi ihe-ọtùtù itù atù, ke agiri-isi na afu-ọnu ahu.
2. Otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēji ọku sure n'etiti obodo ahu, mb͕e ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha ahu zuru ezu; i gēwere kwa otù uzọ n'uzọ atọ, were mma-agha ahu tie ya buruburu obodo ahu; otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēfesara ifufe, ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha.
3. I gēweputa kwa n'ebe ahu agiri-isi di ole-na-ole n'ọnu-ọgugu, ke ha n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-nwuda-gi.
4. Ọ bu kwa nime ndia ka i gēweputa kwa ufọdu ọzọ, tubà ha n'etiti ọku ahu, sure ha n'ọku; nime ya ka ọku gēsi pukuru ulo Israel nile.
5. Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Nka bu Jerusalem: n'etiti mba nile ka M'doworo ya, ala di iche iche di kwa ya buruburu.
6. O we nupu isi n'okpuru ikpém nile n'imebi iwu kari mba nile, na n'okpuru ukpurum nile karia ala nile nke di ya buruburu: n'ihi na ikpém nile ka ha juworo, ma ukpurum nile, ha ejegharighi nime ha.
7. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, ji si otú a: N'ihi na unu nātu ùzù kari mba nile nke di unu buruburu, unu we ghara ijeghari n'ukpurum nile, ghara kwa ime ihe nile M'kpere n'ikpe, ọ bughi kwa dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo;
8. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, ọbuná Mu onwem; M'gēme kwa ihe nile nke ekpere n'ikpe n'etiti gi n'anya mba nile.
9. M'gēme kwa nime gi ihe ahu nke M'nēmeghi na mb͕e gara aga, nke M'nāgaghi-eme kwa ihe di ka ya ọzọ, n'ihi ihe-árú-gi nile.
10. N'ihi nka ka ndi bu nna gēri umu-ha n'etiti gi, umu gēri kwa ndi bu nna-ha; M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe nime gi, M'gāb͕asa kwa ndi-gi nile fọduru nye ifufe nile.
11. N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na ebe nsọm ka i meruworo n'ihe-gi nile nke jọb͕uru onwe-ha, na n'ihe-árú-gi nile, n'ihi ya Mu onwem aghaghi kwa ibilata gi; anyam agaghi-eme kwa ebere; ọzọ kwa, Mu onwem agaghi-enwe ọmiko.
12. Otù uzọ n'uzọ atọ nime gi gānwu site n'ajọ ọria nēfe efe, ọ bu kwa site n'oké unwu ka ha gāgwusi n'etiti gi; otù uzọ n'uzọ atọ gāda site na mma-agha buruburu gi; ọzọ, otù uzọ n'uzọ atọ ka M'gāb͕asa nye ifufe nile, M'gāmiputa kwa mma-agha n'azu ha.
13. Ewe mezue iwem, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru ha, ewe kasiem obi: ha gāmara kwa na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu n'ekworom, mb͕e M'gēmezuwori ọnumam n'aru ha.
14. Ọzọ, M'gēme gi ka i ghọ nkpọnkpọ ebe na ihe-ita-uta, n'etiti mba nile nke di gi buruburu, n'anya onye ọ bula nke nāgabiga.
15. Ọ gābu-kwa-ra mba nile nke di gi buruburu ihe-ita-uta, na ihe-nkwulu, na ihe-idọ-aka-na-nti, na ihe-iju-anya, mb͕e M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe nime gi n'iwe, na n'ọnuma, na n'iba-nba nile nke ọnuma: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo:
16. mb͕e M'gēziga àkú ọjọ nile nke oké unwu n'etiti ha, bú àkú nke diri nbibi, nke M'gēziga ibibi unu; ọ bu kwa oké unwu ka M'gātukwasiri unu, M'we b͕ajiere unu nkpa-n'aka, bú achicha;
17. M'gēzikwasi kwa unu oké unwu na ajọ anu-ọhia, ha gāb͕aba kwa unu aka nwa; ajọ ọria nēfe efe na ọbara gāgabiga kwa n'etiti gi; ọ bu kwa mma-agha ka M'gēme ka ọ biakwasi gi: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.
About Ezikiel Chapter 5
Read Ezikiel Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezikiel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ezikiel
Chapter: 5
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ezikiel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ezikiel Chapter 5 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ezikiel Chapter 5?
Ezikiel Chapter 5 is part of the Book of Ezikiel in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ezikiel Chapter 5 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
Explore More from Ezikiel
- Ezikiel Chapter 46
- Ezikiel Chapter 17
- Ezikiel Chapter 25
- Ezikiel Chapter 16
- Ezikiel Chapter 37
- Ezikiel Chapter 28
- Ezikiel Chapter 15