Ilu Chapter 17

For English

Read Ilu Chapter 17 Online

Read Ilu Chapter 17 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 17

Isi 17

1. Ọ di nma iri iberibe achicha kpọrọ nku, ma inọ-n'udo adi ya, Kari ulo juputara n'àjà anēri nālu ọ̀gù.

2. Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere, Ọ bu kwa n'etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa.

3. Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo: Ma Onye nānwa obi bu Jehova.

4. Onye nēme ihe ọjọ nātọ nti n'ala n'eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ajọ ihe; Onye-okwu-ugha nāṅa nti ire nēkwu ihe-ila-n'iyì.

5. Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta: Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

6. Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu; Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.

7. Ọ maghi nma n'ebe onye-nzuzu nọ, bú eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ihe makarisiri nma: Èb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu-ugha gēsi kwa aṅa ma nma n'ebe onye amara aha-ya nọ?

8. Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya: Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.

9. Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n'anya: Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì.

10. Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọta Kari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu.

11. Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ; Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya.

12. Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu, Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.

13. Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.

14. Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di: N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.

15. Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe, Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.

16. N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe, Mb͕e obi amam-ihe nādighi?

17. Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya, Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.

18. Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n'aka ibu onye-mbe, Ọ nāghọ onye nọ na mbe n'iru madu-ibe-ya.

19. Onye nāhu njehie n'anya nāhu ilu-ọ̀gù n'anya: Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia.

20. Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe: Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n'ire-ya gādabà n'ihe ọjọ.

21. Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú: Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.

22. Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma: Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.

23. Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya, Iwezuga uzọ nile nke ikpé.

24. N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di: Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.

25. Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu, Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu.

26. Ọzọ, iri onye ezi omume nra adighi nma, Ọ dighi kwa nma itib͕u ndi amara aha-ha n'ihi izi-ezi-ha.

27. Onye nēb͕ochi okwu-ọnu-ya mara ihe-ọmuma: Ọzọ, onye mọ-ya juru ajuru bu onye-nghọta.

28. Ọbuná onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ, mb͕e ọ nāb͕a, anāgu ya n'onye mara ihe: Onye nēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye-nghọta.

About Ilu Chapter 17

Read Ilu Chapter 17 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 17
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 17 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 17?

Ilu Chapter 17 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 17 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 9
  2. Ilu Chapter 18
  3. Ilu Chapter 24
  4. Ilu Chapter 23
  5. Ilu Chapter 25
  6. Ilu Chapter 3
  7. Ilu Chapter 27

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 101
  2. II. Ihe Emere Chapter 20
  3. II. Ndi-Eze Chapter 14
  4. Ilu Chapter 31
  5. Aisaia Chapter 48
  6. Aisaia Chapter 10
  7. Matiu Chapter 13
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *