II. Ihe Emere Chapter 10

For English

Read II. Ihe Emere Chapter 10 Online

Read II. Ihe Emere Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ihe Emere in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ihe Emere and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

II. Ihe Emere 10

Isi 10

1. Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru ime ya eze.

2. O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nọ n'Ijipt, ebe o siri n'iru Solomon, bú eze, b͕alaga,) na Jeroboam siri n'Ijipt lata.

3. Ha we ziga, kpọ ya; Jeroboam na Israel nile we bia, gwa Rehoboam okwu, si,

4. Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè.

5. Ọ si ha, Mb͕e ubọchi atọ gasiri unu laghachikutekwam. Ndi Israel we la.

6. Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon nna-ya mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu?

7. Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka onye ọma, ihe-ha we tọ gi utọ, i we gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile.

8. Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n'iru ya.

9. Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi?

10. Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāsi ha, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam.

11. Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

12. Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n'ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutenum n'ubọchi nke-atọ.

13. Eze we za ha okwu ike; eze, bú Rehoboam, we rapu idu-ọdu nke ndi-okenye,

14. gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na ya: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

15. Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Chineke, ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Ọ gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo.

16. Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jesi: lanu, nwoke ọ bula, n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel nile we la n'ulo-ikwū-ha.

17. Ma umu Israel ndi bi n'obodo nile nke Juda, Rehoboam we buru eze-ha.

18. Eze, bú Rehoboam, we ziga Hadoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; umu Israel we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n'ubọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem.

19. Israel we jehie megide ulo Devid, rue ta.

About II. Ihe Emere Chapter 10

Read II. Ihe Emere Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ihe Emere in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: II. Ihe Emere
Chapter: 10
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ihe Emere. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading II. Ihe Emere Chapter 10 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is II. Ihe Emere Chapter 10?

II. Ihe Emere Chapter 10 is part of the Book of II. Ihe Emere in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete II. Ihe Emere Chapter 10 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from ii ihe emere

  1. II. Ihe Emere Chapter 13
  2. II. Ihe Emere Chapter 23
  3. II. Ihe Emere Chapter 36
  4. II. Ihe Emere Chapter 21
  5. II. Ihe Emere Chapter 29
  6. II. Ihe Emere Chapter 27
  7. II. Ihe Emere Chapter 17

Related Chapters & Readings

  1. II. Ndi Kọrint Chapter 12
  2. Luk Chapter 10
  3. Abù Ọma Chapter 40
  4. Jud Chapter 1
  5. Ọpupu Chapter 15
  6. Nehemaia Chapter 6
  7. Aisaia Chapter 40
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *