Ndi-Ikpe Chapter 19

For English

Read Ndi-Ikpe Chapter 19 Online

Read Ndi-Ikpe Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi-Ikpe and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ndi-Ikpe 19

Isi 19

1. O rue, na mb͕e ahu, mb͕e eze nādighi n'Israel, na otù nwoke, bú onye Livai, di nānọ dika ọbìa n'akuku azu ugwu Efraim, o we si na Bet-lehem-juda kuru n'onwe-ya nwayi bu iko.

2. Iko-ya nwayi ahu we kwa iko megide ya, si n'ebe ọ nọ la n'ulo nna-ya rue Bet-lehem-juda, nọ n'ebe ahu ubọchi ruru ọnwa anọ.

3. Nwoke-ya we bilie, jeso ya, igwa ya okwu gābà ya n'obi, ime ka ọ lata, nwa-okorọbia-ya na inyinya-ibu abua soro kwa ya je: nwayi ahu we me ka ọ ba n'ulo nna-ya: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, ṅuria izute ya.

4. Ọgọ-ya nwoke, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, we jide ya; o we nọ n'ulo-ya ubọchi atọ: ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.

5. O rue, n'ubọchi nke-anọ, na ha biliri n'isi-ututu, o we bilie ila: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si ọgọ-ya, Were iberibe achicha nwe ume n'obi-gi, ma emesia unu gāla.

6. Ha we nọdu, rikọ ihe, ṅukọ kwa ihe-ọṅuṅu, ha abua: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si nwoke ahu, Biko, kwere, nọ ọnọdu-abali, ka obi-gi di kwa nma.

7. Nwoke ahu we bilie ila; ma ọgọ-ya rugidere ya, o we chigharia nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.

8. O we bilie n'isi-ututu n'ubọchi nke-ise ila; nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si, Biko, nwe ume n'obi-gi, o we b͕agwoju ha anya rue mb͕e ubọchi rudara; ha abua we rikọ ihe.

9. Nwoke ahu we bilie ila, ya onwe-ya, na iko-ya nwayi, na nwa-okorọbia-ya; ma ọgọ-ya, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, siri ya, Biko, le, ike agwu ubọchi, o rubewo anyasi, biko, nọnu ọnọdu-abali: le, ubọchi erudawo, nọ ọnọdu-abali n'ebe a, ka o we diri obi-gi nma; ma bilienu n'isi-ututu echi ije ije-unu, ka i we la n'ulo-ikwū-gi.

10. Ma nwoke ahu ekweghi inọ ọnọdu-abali, kama o biliri la, o we biarue ncherita-iru Jebus (nke ahu bu Jerusalem): inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa nēso kwa ya, iko-ya nwayi nēso kwa ya.

11. Mb͕e ndi ahu nọ nso Jebus, ubọchi jemiri nke-uku; nwa-okorọbia ahu we si onye-nwe-ya, Biko, bia, ka ayi wezuga onwe-ayi jerue obodo a nke ndi Jebus, nọ ọnọdu-abali nime ya.

12. Onye-nwe-ya we si ya, Ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi jerue obodo onye ala ọzọ, ebe onye sitere n'umu Israel nānọghi; kama ayi gāgabiga rue Gibea.

13. O we si nwa-okorọbia-ya, Bia, ka ayi biarue nso otù nime ebe ndia; ayi gānọ kwa ọnọdu-abali na Gibea, ma-ọbu na Rema.

14. Ha we gabiga, nēje ije-ha; anyanwu we dakpugide ha n'akuku Gibea, nke diri Benjamin.

15. Ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, ibà inọ ọnọdu-abali na Gibea: ọ ba, nọdu n'amá obodo ahu: ma ọ dighi nwoke nāchikọta ha ba n'ulo-ya inọ ọnọdu-abali.

16. Ma, le, otù agadi nwoke siri n'ọlu-ya, bú n'ubi, bia n'anyasi; ma nwoke ahu sitere n'ugwu Efraim, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa na Gibea: ma ndikom ebe ahu bu ndi Benjamin.

17. O welie anya-ya abua, hu onye-ije ahu n'amá obodo; agadi nwoke ahu we si, Òle ebe i nēje? òle ebe i si bia kwa?

18. Ọ si ya, Ayi onwe-ayi nēsi na Bet-lehem-juda gabiga rue akuku azu ugwu Efraim; ebe ahu ka m'si bia, m'we je Bet-lehem-juda: ọ bu kwa ulo Chineke ka mu onwem nēje; ma ọ dighi nwoke nāchikọtam na ndim n'ulo-ya.

19. Otú ọ di, ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo diri inyinya-ibu-ayi; ọzọ kwa, achicha na manya-vine dirim, di-kwara-ra orù-gi nwayi, di-kwara nwa-okorọbia nke nēso ndi-orù-gi: ọ dighi ihe ọ bula nākọ ayi.

20. Agadi nwoke ahu we si, Udo diri gi; nání, ihe nile nākọ gi dikwasim; nání, anọla ọnọdu-abali n'amá.

21. O we me ka ọ ba n'ulo-ya, gwara inyinya-ibu nri-ha: ha we sa ukwu-ha, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.

22. Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya.

23. Nwoke ahu, bú onye-nwe ulo, we pukuru ha, si ha, É-è, umu-nnem, biko, unu emela ihe ọjọ; ebe nwoke a bataworo n'ulom, unu emela ihe-nzuzu a.

24. Le, nwam nwayi, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, na iko-ya nwayi; biko, ka m'me ka ha puta, weda-kwa-nu ha n'ala, me ha ihe di nma n'anya-unu: ma unu emela nwoke a ihe-nzuzu a.

25. Ma ndikom ahu ekweghi ige nti ya: nwoke ahu we jide iko-ya nwayi, me ka ọ putara ha n'èzí; ha we mara aru-ya, sob͕ugide ya abali ahu nile rue ututu: ha we zilaga ya na chi-ọbubọ.

26. Nwayi ahu we bia n'isi-ututu, da n'ọnu-uzọ ulo nwoke ahu ebe onye-nwe-ya nọ, rue mb͕e ìhè putara.

27. Onye-nwe-ya we bilie n'ututu, meghe ọnu-uzọ ulo ahu, we pua ije ije-ya: ma, le, nwayi ahu, bú iko-ya, adawo n'ọnu-uzọ ulo ahu, aka-ya abua di kwa na nbata-uzọ.

28. Ọ si ya, Bilie, ka ayi la; ma ọ dighi onye nāza: o we būru ya n'elu inyinya-ibu-ya; nwoke ahu we bilie, je rue ebe nke ya.

29. O we ba n'ulo-ya, were mma, jide iko-ya nwayi, bọ̀ ya, dika ọkpukpu-ya nile si di, n'ọbubọ̀ iri na abua, we zisa ya n'ókè-ala nile nke Israel.

30. O rue, na onye ọ bula nke nāhu ya anya siri, Ọ dighi mb͕e emere ka ihe di otú a di, ahughi kwa ihe di otú a site n'ubọchi umu Israel siri n'ala Ijipt rigota rue ta: tukwasinu uche na ya, b͕anu ìzù, kwu-kwa-nu okwu.

About Ndi-Ikpe Chapter 19

Read Ndi-Ikpe Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ndi-Ikpe
Chapter: 19
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi-Ikpe. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ndi-Ikpe Chapter 19 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ndi-Ikpe Chapter 19?

Ndi-Ikpe Chapter 19 is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ndi-Ikpe Chapter 19 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Job Chapter 33
  7. Esta Chapter 7

Explore More from ndi-ikpe

  1. Ndi-Ikpe Chapter 1
  2. Ndi-Ikpe Chapter 14
  3. Ndi-Ikpe Chapter 11
  4. Ndi-Ikpe Chapter 10
  5. Ndi-Ikpe Chapter 18
  6. Ndi-Ikpe Chapter 20
  7. Ndi-Ikpe Chapter 17

Related Chapters & Readings

  1. Ndi Efesọs Chapter 4
  2. Abù Ọma Chapter 121
  3. Ilu Chapter 12
  4. Ndi Filipai Chapter 4
  5. I. Jọn Chapter 1
  6. I. Ihe Emere Chapter 18
  7. I. Ndi-Eze Chapter 15
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *