Read Job Chapter 32 Online
Read Job Chapter 32 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 32
Isi 32
1. Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya.
2. Iwe Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, site n'ab͕uru Ram, we di ọku: megide Job ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ọ guru onwe-ya n'onye ezi omume kari Chineke.
3. Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe.
4. Ma Elaihu chere Job n'ikwu okwu, n'ihi na ndi-okenye ka ha bu kari ya onwe-ya n'ubọchi ndu-ha.
5. Elaihu we hu na ihe-ọziza adighi n'onu ndikom atọ ahu, iwe-ya we di ọku.
6. Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si, Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká; N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara.
7. Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu, Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe.
8. N'ezie mọ di nime madu, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe.
9. Ọ bughi ndi uku mara ihe, Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé.
10. N'ihi nka ka m'siri, Gem nti; M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.
11. Le, echerem okwu-unu, Anamaṅa nti nghọta-unu, Rue mb͕e unu gēgwuputa ala okwu nile.
12. E, anamelekwasi unu anya, Ma, le, ọ dighi onye nēso Job ru uka, Ma-ọbu nke nāza okwu-ọnu-ya nile, n'etiti unu.
13. Lezienu anya ka unu ghara isi, Ayi achọtawo amam-ihe; Chineke gāchipu ya, ọ bughi madu:
14. N'ihi na o doghi okwu-ya n'usoro imegidem; M'gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya.
15. Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ: Ha ewepuwo okwu nile n'ọnu onwe-ha.
16. M'gēcheta kwa, n'ihi na ha adighi-ekwu, N'ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ?
17. M'gāza òkèm, ọbuná mu onwem, M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.
18. N'ihi na ejuputaram n'okwu; Mọ nke di n'afọm akpab͕uwom.
19. Le, afọm di ka manya-vine nke anākwupughi akwupu; Dika karama-akpukpọ ọhu, ọ nāb͕awa ab͕awa.
20. Ka m'kwue, ka aru we dajuam; M'gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum, za.
21. Biko, ka m'ghara ihu nwoke ọ bula iru-ọma; M'gaghi-etu kwa madu aha.
22. N'ihi na amaghm itu aha; Ọ buru otú a Onye kèrem gēbupum na nwa mb͕e ntà.
About Job Chapter 32
Read Job Chapter 32 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 32
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 32 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 32?
Job Chapter 32 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 32 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5