Habakuk Chapter 3

For English

Read Habakuk Chapter 3 Online

Read Habakuk Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Habakuk in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Habakuk and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Habakuk 3

Isi 3

1. Ekpere nke Habakuk, bú onye-amuma, n'elu Shigionoth.

2. Jehova, anuwom ihe anuru bayere Gi, m'tua egwu: Jehova, tute ọlu-Gi n'etiti arọ nile, N'etiti arọ̀ nile ka I gēme ka amara ya; N'oké iwe cheta obi-ebere.

3. Chineke si na Timan nābia, Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. Selah Ebube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile, Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.

4. Onwunwu-Ya di ka ìhè; Ìhè nēnwuputa n'aka-Ya: Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ebe-nzuzo nke ike-Ya di.

5. N'iru Ya ka ajọ ọria nke nēfe efe nāga, Anwuru-ọku si kwa n'ukwu-Ya abua nāputa.

6. O guzoro, we tùa uwa; O lere anya, we me ka mba nile kuja: Ewe tipia ugwu nile di mb͕e ebighi-ebi, Ugwu ntà ebighi-ebi nile ruru ala; Ojije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga bu nke Ya.

7. N'okpuru ajọ ihe ka m'huworo ulo-ikwū nile nke Kushan: Ákwà-nkwuba nile nke ala Midian nāma jijiji.

8. Ọ̀ bu osimiri ka Jehova were oké iwe megide? Ọ̀ bu osimiri ka iwe-Gi nēmegide? Ma ọ̀ bu oké osimiri ka nrubiga-ókè nke iwe-Gi nēmegide? Na I nānọkwasi n'inyinya-Gi nile, N'ub͕ọ-ala-Gi nile nke bu nzọputa.

9. Ab͕abasiri uta-Gi ọtọ; Iyi nile aṅuru ebo-Gi nile bu okwu-ọnu kwesiri ntukwasi-obi. Selah I nēji osimiri b͕awa ala.

10. Ugwu nile huru Gi, we nāb͕ali; Okè miri-ozuzo gabigara: Ob͕u-miri mere ka olu-ya da, Chilie aka-ya elu.

11. Anyanwu na ọnwa guzoro n'ebe-obibi-ha; N'ìhè àkú-Gi nile mb͕e ha nāga, N'onwunwu nke ube-Gi nēb͕upu àmùmà.

12. N'oké iwe ka I nāzọ ije n'ala, N'iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka.

13. I putawo ìhè izọputa ndi-Gi, Izọputa onye-Gi etere manu; I mabipuwo isi n'ulo ndi nēmebi iwu, B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu. Selah

14. I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi: Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam: Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo.

15. I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n'oké osimiri, Bú obo nke ọtutu miri.

16. Anurum, afọm we ma jijiji, N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta; Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji: Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu, Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe.

17. Asi na osisi fig adighi-ama ifuru, Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine; Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo, Na ubi nile emeghi ihe-oriri; Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu, Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi:

18. Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova, M'gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam.

19. Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem, Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele, Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije. Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.

About Habakuk Chapter 3

Read Habakuk Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Habakuk in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Habakuk
Chapter: 3
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Habakuk. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Habakuk Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Habakuk Chapter 3?

Habakuk Chapter 3 is part of the Book of Habakuk in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Habakuk Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Job Chapter 33
  7. Esta Chapter 7

Explore More from Habakuk

  1. Habakuk Chapter 2
  2. Habakuk Chapter 2
  3. Habakuk Chapter 3
  4. Habakuk Chapter 3
  5. Habakuk Chapter 1
  6. Habakuk Chapter 1
  7. Habakuk Chapter 3

Related Chapters & Readings

  1. Luk Chapter 22
  2. Ndi-Hibru Chapter 10
  3. Ndi-Ikpe Chapter 1
  4. Ezikiel Chapter 11
  5. Ezikiel Chapter 9
  6. Ezikiel Chapter 5
  7. Maika Chapter 7
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *