Read Ndi-Hibru Chapter 2 Online
Read Ndi-Hibru Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi-Hibru and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ndi-Hibru 2
Isi 2
1. N'ihi nka ayi aghaghi iṅabiga nti ókè kari n'ihe anuru, ka aghara ibupu ayi n'ebe ha di ma eleghi anya, dika miri nēbupu ub͕ọ.
2. N'ihi na asi na emere okwu ekwuru site n'ọnu ndi-mọ-ozi ka o guzosie ike, asi kwa na njehie nile ọ bula na aṅaghi-nti nile ọ bula natara nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ziri ezi;
3. àyi onwe-ayi gēsi aṅa b͕anari, ma ọ buru na ayi leghara oké nzọputa di otú a anya? bú nzọputa nke eburu uzọ kwu site n'ọnu Onye-nwe-ayi, ndi nuru ya we me ka o guzosie ike rue ebe ayi nọ;
4. Chineke nēso kwa ha nāb͕akọ àmà, site n'ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, site kwa n'ọlu ike di iche iche, site kwa n'òkìkè nke Mọ Nsọ, dika ọchichọ nke aka Ya si di.
5. N'ihi na ọ bughi n'okpuru ndi-mọ-ozi ka O doro elu-uwa dum madu bi nke gaje ibia, bú nke ayi nēkwu okwu bayere ya.
6. Ma otù onye kwusiri ike n'otù ebe, si, Gini ka madu bu, na I nēcheta ya? Ma-ọbu nwa nke madu, na I nēleta ya?
7. I mere ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà; I ji ebube na nsọpuru kpube ya n'isi dika okpu-eze, I do-kwa-ra ya onye-isi ọlu nile nke aka-Gi abua:
8. Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua. N'ihi na na n'ido, ihe nile ahu n'okpuru ya, ọ dighi ihe ọ bula Ọ rapuru nke anēdoghi n'okpuru ya. Ma ub͕u a ayi akāhughi ihe nile ahu na edowo ha n'okpuru ya.
9. Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n'isi dika okpu-eze n'ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n'amara Chineke detu ọnwu ire n'ihi madu nile ọ bula.
10. N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè.
11. N'ihi na ma Onye nēdo ha nsọ ma ndi anēdo nsọ, ha nile sitere n'otù Nna: ọ bu kwa n'ihi ihe a ka ihere ikpọ ha umu-nna-Ya adighi-eme Ya,
12. Ọ si, Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi, N'etiti nzukọ-Gi k m'gābù abu nye Gi.
13. Ọzọ kwa, Mu onwem ganātukwasi obim na Ya. Ọzọ kwa, Le, Mu onwem na umu-ntakiri Chineke nyerem.
14. Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n'otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n'ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu;
15. ka O we site kwa n'ọnwu naputa ndi ahu, ka ha ra, bú ndi ewere egwu ọnwu tinye n'ibu-orù n'ogologo ndù-ha nile.
16. N'ihi na ọ bu ihe amara nke-ọma na ọ bughi ndi-mọ-ozi ka Ọ nējide aka, kama Ọ nējide nkpuru Abraham aka.
17. O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.
18. N'ihi na ebe Ya onwe-ya huworo ahuhu site n'ọnwunwa anwara Ya, Ọ puru iyere ndi anānwa aka.
About Ndi-Hibru Chapter 2
Read Ndi-Hibru Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ndi-Hibru
Chapter: 2
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi-Hibru. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ndi-Hibru Chapter 2 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ndi-Hibru Chapter 2?
Ndi-Hibru Chapter 2 is part of the Book of Ndi-Hibru in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ndi-Hibru Chapter 2 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Nkpugh Chapter 4
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 6
- Nkpugh Chapter 13
Explore More from ndi-hibru
- Ndi-Hibru Chapter 5
- Ndi-Hibru Chapter 11
- Ndi-Hibru Chapter 6
- Ndi-Hibru Chapter 3
- Ndi-Hibru Chapter 8
- Ndi-Hibru Chapter 1
- Ndi-Hibru Chapter 7