Job Chapter 36

For English

Read Job Chapter 36 Online

Read Job Chapter 36 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Job 36

Isi 36

1. Elaihu we nēkwu kwa, si,

2. Cherem nwa mb͕e ntà, m'gēkwuputa-kwa-ra gi; N'ihi na okwu ọzọ di ikwuru Chineke.

3. M'gēsi n'ebe di anya bute ọmuma-ihem, Ọ bu kwa Onye kpurum ka m'gēnye ezi omume.

4. N'ihi na n'ezie ọ bughi okwu-ugha ka okwum nile bu: Onye zuru okè n'ọmuma-ihe nọyere gi.

5. Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula: Ọ di ike n'ike nke obi.

6. Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu: Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.

7. Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume: Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-eze Ka Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.

8. Ma ọ buru na ejide ha n'udọ̀ nke nweda-n'ala, Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu;

9. O we nēgosi ha ọlu-ha, Na njehie nile ha, na ha nēme onwe-ha ndi di ike megide Ya.

10. O nēkpughe kwa nti-ha idọ ha aka na nti, Ọ si ha si n'ajọ ihe laghachi.

11. Ọ buru na ha anu, we fè Ya òfùfè, Ha gēme ka ubọchi nile ha gwusia n'ọdi-nma, Me kwa ka arọ nile ha gwusia n'ihe-utọ.

12. Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha, Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.

13. Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi: Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.

14. Nkpuru-obi-ha nānwu na nwata, Ndu-ha nāla kwa n'iyì n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko.

15. Ọ nādọputa onye ewedara n'ala na nweda-n'ala-ya. Ọ nēkpughe kwa nti-ha nime nmeb͕u.

16. Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕u Ba n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya; Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba.

17. Ma i juputawo n'okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu: Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi.

18. N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe; Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.

19. Ọ̀ gēdo àkù-gi n'usoro ka i ghara inọ na nkpà? Ma-ọbu ume nile nke ike-gi?

20. Ekusila ume ike ibiaru abali, Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n'ọnọdu-ha.

21. Lezie anya, echela ajọ ihe iru: N'ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n'ala.

22. Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya: Ònye bu onye-ozizí dika Ya?

23. Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya? Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume?

24. Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku, Bú nke madu bùworo abù bayere ya.

25. Madu nile elewo ya anya; Madu nēlegide ya site n'ebe di anya.

26. Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya; Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa.

27. N'ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri, Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya:

28. Nke mbara-ígwé nāwuda, nātasa madu n'uba.

29. Ọzọ, ọ̀ di onye nāghọta nb͕asa igwe-oji Nbib͕ọ nke ulo-ntu-Ya?

30. Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n'elu ya; Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra.

31. N'ihi na ndia ka O ji nēkpe ndi nile di iche iche ikpe; Ọ nēnye ihe-oriri n'uba.

32. Ọ jiwo ìhè kpuchi ọbu-aka-Ya abua; We nye ya iwu imegide onye nēmegide Ya.

33. Nkpọtu-ya nēgosi ihe bayere Ya, Gosi kwa anu-ulo ihe bayere Onye nārigo.

About Job Chapter 36

Read Job Chapter 36 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Job
Chapter: 36
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Job Chapter 36 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Job Chapter 36?

Job Chapter 36 is part of the Book of Job in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Job Chapter 36 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Ilu Chapter 1
  7. Job Chapter 33

Explore More from Job

  1. Job Chapter 5
  2. Job Chapter 32
  3. Job Chapter 36
  4. Job Chapter 41
  5. Job Chapter 14
  6. Job Chapter 39
  7. Job Chapter 7

Related Chapters & Readings

  1. Aisaia Chapter 64
  2. I. Ndi Tesalọnaika Chapter 5
  3. Nkpugh Chapter 4
  4. Hagai Chapter 2
  5. Joshua Chapter 17
  6. Emos Chapter 9
  7. Ezikiel Chapter 17
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *