Read Job Chapter 29 Online
Read Job Chapter 29 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 29
Isi 29
1. Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,
2. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na adim dika m'si di n'ọnwa gara aga, Dika n'ubọchi nile mb͕e Chineke nēdebem;
3. Mb͕e o nēnwu n'elu isim, bú oriọna-Ya, Ìhè-Ya ka m'nēji eje ije n'ọchichiri;
4. Otú m'diri n'ubọchi ihe nāgaram nke-ọma, Mb͕e ìzù nzuzo Chineke dikwasi ulo-ikwūm;
5. Mb͕e Onye puru ime ihe nile nānọyerem, Mb͕e umu-ntakirim nọrom buruburu;
6. Mb͕e ewere miri-ara-ehi raru araru sa nzọ-ukwum nile, Mb͕e oké nkume nāwuputaram miri-iyi nke bu nání manu!
7. Mb͕e m'puru je rue ọnu-uzọ-ama n'akuku obodo, Mb͕e m'nēdozi ebe-ọnọdum n'amá,
8. Umu-okorọbia hurum, zobe onwe-ha, Ndi kara nká biliri, guzo;
9. Ndi-isi kwubìri okwu nile ha, Tukwasi ọbu-aka-ha n'ọnu-ha;
10. Anubìri olu ndi-ndú, Ire-ha rapa-kwa-ra n'okpo-ọnu-ha;
11. N'ihi na nti nurum, we kpọm onye ihe nāgara nke-ọma; Anya hu-kwa-ram, we b͕aram àmà:
12. N'ihi na m'mere onye ewedara n'ala nke nētikum ka o wepuga onwe-ya, Ya na nwa-nb͕ei, bú onye nēnweghi onye nēyere ya aka.
13. Ngọzi nke onye nāla n'iyì nābiakwasim: M'nēme kwa obi nwayi di-ya nwuru ka o tie nkpu ọṅù.
14. Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya: Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi.
15. Anya ka m'ghọro n'ebe onye-ìsì nọ, Ukwu n'ebe onye-ngwurọ nọ ka m'ghọ-kwa-ra.
16. Nna ka m'buru ndi-ob͕eye: Okwu-ikpé m'nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya.
17. M'we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume, Si n'ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru.
18. M'we si, N'akwum ka m'gēkubì ume, Dika ájá ka m'gēme kwa ka ubọchim ba uba:
19. Awasawo nkpọrọgwum n'ebe miri di, Igirigi gānọ kwa ọnọdu-abali n'alakam:
20. Nsọpurum di ọhu nimem, Utam gāb͕anwe kwa ọhu n'akam.
21. Mu ka madu gere nti, we chere, Ha nānọ kwa dū inu ndum-ọdum.
22. Mb͕e okwum gwusiri, ha adighi-ekwu kwa okwu-ha nke ub͕ò abua; Okwum nābukwasi kwa ha dika miri-ozuzo.
23. Ha nēcherekwam dika esi echere miri-ozuzo; Ha saghepu-kwa-ra ọnu-ha dika ọ bu inara miri-ozuzo ikpe-azu.
24. M'chìa ha ọchì, ha adighi-ekwere; Ha adighi-eme kwa ka ìhè irum da.
25. M'nārọputa uzọ-ha, nọdu kwa ka onye-isi, Biri kwa dika eze si ebi n'usu-ya, Dika onye nākasi ndi nēru újú obi.
About Job Chapter 29
Read Job Chapter 29 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 29
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 29 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 29?
Job Chapter 29 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 29 online for free with easy chapter navigation.