Read I. Ndi Tesalọnaika Chapter 5 Online
Read I. Ndi Tesalọnaika Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi Tesalọnaika in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Ndi Tesalọnaika and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
I. Ndi Tesalọnaika 5
Isi 5
1. Ma ọ dighi unu nkpà, umu-nna-ayi, ka edegara unu akwukwọ bayere oge ahu nile na ubọchi ahu nile.
2. N'ihi na unu onwe-unu matara nke-ọma na dika onye-ori nābia n'abali, otú a ka ubọchi nke Onye-nwe-ayi nābia.
3. Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.
4. Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, anọghi n'ọchichiri, ka ubọchi ahu we jide unu na mberede dika onye-ori:
5. n'ihi na unu onwe-unu nile bu umu nke ìhè, na umu nke ehihie: ayi abughi ndi nke abali, ma-ọbu nke ọchichiri;
6. ya mere otú a, ka ayi ghara iraru ura, dika ndi fọduru, kama ka ayi nēche nche nwe kwa anya-udo.
7. N'ihi na ndi nāraru ura nāraru ura n'abali; ndi nāṅubiga kwa manya ókè nāṅubiga n'abali.
8. Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi bu ndi nke ehihie, ka ayi nwe anya-udo, yikwasikwa ihe-agha ib͕ochi obi, bú okwukwe na ihunanya; ya na okpu-agha, bú ile-anya nzọputa.
9. N'ihi na Chineke edebeghi ayi inata iwe, kama inweta nzọputa site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist,
10. Onye nwuru n'ihi ayi, ka ọ gābu, ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu.
11. N'ihi nka nākasiritanu ibe-unu obi, wulirita kwa ibe-unu elu dika ulo, dika unu nēme kwa.
12. Ma ayi nēkpere unu, umu-nna-ayi, ka unu mata ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu n'etiti unu, ndi bu kwa ndi-isi-unu nime Onye-nwe-ayi, ndi nādu kwa unu ọdú;
13. ka unu were kwa ihunanya sọpuru ha gabiga ókè nke-uku ri nne n'ihi ọlu-ha. Birinu n'udo n'etiti onwe-unu.
14. Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ.
15. Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ.
16. Nāṅurinu ọṅu mb͕e nile;
17. nēkpenu ekpere nēwepughi aka;
18. nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ.
19. Unu emenyula Mọ Nsọ;
20. unu akpọla ibu-amuma ihe-efu;
21. nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike;
22. unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula.
23. Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n'uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
24. O kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye ahu nākpọ unu, Onye gēme kwa ya.
25. Umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi.
26. Werenu isutu-ọnu di nsọ kele umu-nna-ayi nile.
27. Ewerem Onye-nwe-ayi b͕a unu iyi ka aguara umu-nna-ayi nile akwukwọ-ozi a.
28. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu.
About I. Ndi Tesalọnaika Chapter 5
Read I. Ndi Tesalọnaika Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi Tesalọnaika in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: I. Ndi Tesalọnaika
Chapter: 5
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Ndi Tesalọnaika. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading I. Ndi Tesalọnaika Chapter 5 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is I. Ndi Tesalọnaika Chapter 5?
I. Ndi Tesalọnaika Chapter 5 is part of the Book of I. Ndi Tesalọnaika in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete I. Ndi Tesalọnaika Chapter 5 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Nkpugh Chapter 4
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 6
- Nkpugh Chapter 13
Explore More from i-ndi-tesalọnaika
- I. Ndi Tesalọnaika Chapter 2
- I. Ndi Tesalọnaika Chapter 3
- I. Ndi Tesalọnaika Chapter 1
- I. Ndi Tesalọnaika Chapter 4