Joshua Chapter 17

For English

Read Joshua Chapter 17 Online

Read Joshua Chapter 17 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Joshua and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Joshua 17

Isi 17

1. Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.

2. Ife-nzà di kwa nke mara umu Manase fọduru dika ab͕uru nile ha si di; ọ diri umu Abieza, di-kwa-ra umu Hilek, di-kwa-ra umu Asriel, di-kwa-ra umu Shekem, di-kwa-ra umu Hifa, di-kwa-ra umu Shemida: ndia bu umu-ndikom Manase nwa Josef dika ab͕uru nile ha si di.

3. Ma Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: ndia bu kwa aha umu-ya ndinyom, Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.

4. Ha we biarue nso n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru Joshua nwa Nun, na n'iru ndi-isi, si, Jehova nyere Moses iwu inye ayi ihe-nketa n'etiti umu-nne-ayi: o we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha dika okwu-ọnu Jehova si di.

5. Òkè iri we dabara Manase, nāgughi ala Gilead na Beshan, nke di n'ofè Jọdan;

6. n'ihi na umu-ndinyom Manase ketara ihe-nketa n'etiti umu-ya ndikom: ala Gilead kwa, umu-ndikom Manase fọduru nwere ya.

7. Ókè-ala Manase we si n'Asha rue Mikmetat, nke di n'iru Shekem; ókè-ala ahu we je rue aka-nri, rue ndi bi n'En-tapua.

8. Manase nwe ala Tapua: ma umu Efraim nwe Tapua rue ókè-ala Manase.

9. Ókè-ala ahu we rida rue miri-iyi Kena, n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: obodo ndia ka Efraim nwere n'etiti obodo Manase: ókè-ala Manase we di n'akuku Ugwu miri-iyi ahu, ọpupu-ya we di n'oké osimiri:

10. n'akuku Ndida ọ diri Efraim, ma n'akuku Ugwu ọ diri Manase, oké osimiri bu kwa ókè-ala-ya; ha we metu Asha n'Ugwu, metu kwa Isaka n'ọwuwa-anyanwu.

11. Manase nwekwara obodo n'Isaka na n'Asha, bú Bet-shean na umu-obodo-ya, na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na En-doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, bú ebe di elu atọ ahu.

12. Ma umu Manase apughi inapu ndi bi n'obodo ahu ala-ha; ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n'ala ahu.

13. O rue, mb͕e umu Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n'ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha.

14. Umu Josef we gwa Joshua okwu, si, Gini mere i nyeworom otù ihe-ife-nzà na otù òkè n'ihe-nketa; ma mu onwem bu ndi bara uba, n'ihi na Jehova agọziwom rue ub͕u a?

15. Joshua we si ha, Ọ buru ndi bara uba ka i bu, rigorue oké ọhia n'onwe-gi, b͕utu-kwa-ra onwe-gi n'ebe ahu n'ala ndi-Perizait na Refaim; ebe ugwu Efraim diri gi nkpa.

16. Umu Josef we si, Ugwu a ezughi ayi: ma ub͕ọ-ala ígwè di n'aka ndi Kenean nile ndi bi n'ala ndagwurugwu, ma ndi bi na Bet-shean na umu-obodo-ya, ma ndi bi na Jezreel.

17. Joshua we gwa ulo Josef, bú Efraim na Manase, okwu, si, Ndi bara uba ka i bu, ọ bu kwa ike uku ka i nwere: i gaghi-enwe nání otù ihe-ife-nzà:

18. n'ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n'ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n'ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.

About Joshua Chapter 17

Read Joshua Chapter 17 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Joshua
Chapter: 17
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Joshua. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Joshua Chapter 17 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Joshua Chapter 17?

Joshua Chapter 17 is part of the Book of Joshua in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Joshua Chapter 17 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 7
  6. Esta Chapter 4
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from joshua

  1. Joshua Chapter 13
  2. Joshua Chapter 4
  3. Joshua Chapter 5
  4. Joshua Chapter 23
  5. Joshua Chapter 12
  6. Joshua Chapter 18
  7. Joshua Chapter 22

Related Chapters & Readings

  1. Aisaia Chapter 39
  2. I. Ndi Kọrint Chapter 4
  3. II. Ihe Emere Chapter 25
  4. Ilu Chapter 10
  5. Ilu Chapter 13
  6. I. Samuel Chapter 25
  7. Abù Ọma Chapter 132
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *