Read Job Chapter 15 Online
Read Job Chapter 15 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 15
Isi 15
1. Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2. Onye mara ihe, ọ̀ gēwere ọmuma-ihe nke bu nání ifufe za? Ọ̀ gēmeju kwa afọ-ya n'ifufe Iru-anyanwu?
3. Ọ̀ gēwere okwu nābaghi n'ihe ru uka, Ma-ọbu okwu nke ọ nējighi ha bara madu urù?
4. E, gi onwe-gi nēmebi egwu, Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke.
5. N'ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe, I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ.
6. Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem; Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi.
7. Ì bu madu mbu amuru? Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?
8. Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti? Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?
9. Gini ka i mara nke ayi nāmaghi? Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?
10. Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi, Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.
11. Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà, Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?
12. Gini mere obi-gi ji ebupu gi? Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?
13. Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke, We me ka okwu nile di otú a si n'ọnu-gi puta.
14. Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi, Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?
15. Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi; Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n'anya-Ya.
16. Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya, Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?
17. M'gēkwuputara gi, gem nti; Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:
18. (Nke ndi mara ihe nēgosi Site na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;
19. Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala, Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)
20. Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali, Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.
21. Olu oké egwu di na nti-ya abua; Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:
22. Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n'ochichiri lata, Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:
23. Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di? Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya:
24. Ahuhu na nkpà nēme ka ọ tua egwu nke-uku; Ha nwere ike n'aru ya, dika eze nke nọ na njikere ibu agha:
25. N'ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke, Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike;
26. Ọ nēwere olu kwesiri ike b͕akwasi Ya, Were kwa ihe-nb͕ochi di ib͕idi nke ọta-ya:
27. Nihi na o werewo abuba-ya kpuchie iru-ya, Me ka abuba nke di arọ́ di n'úkwù-ya;
28. O we biri n'obodo ezopuru n'uwa, Nime ulo nke madu nādighi-ebi nime ha, Nke ejikereworo ighọ obo-ihe.
29. Ọ gāghi-abu ọgaranya, àkù-ya adighi-eguzosi kwa ike, Ọ dighi-eseti kwa ihe ha nwere n'uwa.
30. Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya; Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku, Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya.
31. Ka ọ ghara ikwere n'ihe-efu, eduhiewo ya: N'ihi na ihe-efu gābu ihe-nb͕anwe-ya.
32. Tutu ubọchi-ya erue ka agēmezu ya, Alaka-ya agaghi-adi ka ahihia ndu.
33. Ọ gēnwosisi nkpuru-vine-ya nke nāchaghi acha, dika osisi vine, Ọ gātuda kwa okoko-osisi-ya, dika osisi olive.
34. N'ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa, Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.
35. Ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe, Afọ-ha nēdozi kwa aghughọ.
About Job Chapter 15
Read Job Chapter 15 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 15
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 15 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 15?
Job Chapter 15 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 15 online for free with easy chapter navigation.