Job Chapter 21

For English

Read Job Chapter 21 Online

Read Job Chapter 21 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Job 21

Isi 21

1. Job we za, si,

2. Nurunu okwum nke-ọma; Ka nka buru kwa nkasi-obi-nnu.

3. Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu; Ma mb͕e m'kwusiri okwu, i gāchì ọchì.

4. Mu onwem, ọ̀ bu madu ka m'nātamuru ntamu? Ma ọ buru na ọ di otú a, gini mere mọm nējighi arapu ibu ihe nādighi-ewe iwe ọsọsọ?

5. Chenum iru, ka ibobo nwu kwa unu n'aru, Tukwasi-kwa-nu aka n'ọnu.

6. Ọ buru kwa na echetam, anam-ama jijiji, Ima-jijiji ejidewo kwa anu-arum.

7. Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu, Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà?

8. Emewo ka nkpuru-ha so ha guzosie ike n'iru ha, Emewo kwa ka umu nke putara n'aru-ha guzosie ike n'anya-ha.

9. Ulo-ha di n'udo pua n'oké egwu, Nkpa-n'aka Chineke adighi kwa n'aru ha.

10. Oke-ehi-ya nāb͕à nne-ehi, ọ dighi-ab͕ahie; Nne-ehi-ya nāmu nwa, ọ dighi-ekwo ime.

11. Ha nēzipu umu-ha nāṅu ara dika ìgwè ewu na aturu, Umu-ha nēte kwa egwú.

12. Ha nēweli olu-ha n'egwú-otiti na ubọ-akwara, Nāṅuri kwa ọǹu n'olu ọ̀jà.

13. Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma, Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ.

14. Ha we si Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi; N'ihi na ọmuma uzọ-Gi nile atọghi ayi utọ.

15. Gini bu Onye Nke puru ime ihe nile, nke ayi gābu orù-Ya? Gini ka ọ gābara ayi, ma ayi riọ Ya aririọ?

16. Le, ọ bughi n'aka-ha ka ọdi-nma-ha di: Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.

17. Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu? Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha? Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?

18. Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?

19. Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya. Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.

20. Ka anya-ya abua hu nbibi-ya, Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.

21. N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri, Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti?

22. Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.

23. Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè, Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo:

24. Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi, Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.

25. Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi, Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.

26. Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ, Ikpuru nēkpuchi kwa ha.

27. Le, amawom èchìchè-unu, Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike.

28. N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di? Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa?

29. Ùnu ajughi ndi nāgabiga n'uzọ? Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha?

30. Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ? Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?

31. Ònye gēgosi uzọ-ya n'iru ya? Ihe ahu kwa nke o mere, ònye gākwughachi ya?

32. Ma agēburu onye ahu rue ílì, Ọ gēche kwa nche n'elu obo-ya.

33. Ọkpurukpu-àjà nke ndagwurugwu gātọ ya utọ, Madu nile gādọrọ onwe-ha iso ya n'azu, Dika ndi anāpughi igu ọnu buru ya uzọ.

34. Ùnu si kwa aṅa kasiem obi n'efu, Ebe nání nmekpu fọduru nime nzaghachi nile unu?

About Job Chapter 21

Read Job Chapter 21 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Job
Chapter: 21
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Job Chapter 21 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Job Chapter 21?

Job Chapter 21 is part of the Book of Job in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Job Chapter 21 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Job

  1. Job Chapter 38
  2. Jób Chapter 25
  3. Jób Chapter 14
  4. Job Chapter 39
  5. Job Chapter 14
  6. Job Chapter 16
  7. Job Chapter 22

Related Chapters & Readings

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Joel Chapter 1
  3. Ezikiel Chapter 34
  4. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 15
  5. Deuteronomi Chapter 28
  6. Abù Ọma Chapter 90
  7. Hagai Chapter 2
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *