Job Chapter 5

For English

Read Job Chapter 5 Online

Read Job Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Job 5

Isi 5

1. Biko, kpọ òkù; ọ̀ di onye nāza gi? Ònyè n'etiti ndi nsọ ka i gēche kwa iru?

2. N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya, Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.

3. Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu: M'we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede.

4. Umu-ya nānọpu anya n'ebe nzọputa di, Ewe zọpia ha n'ọnu-uzọ-ama, Ọ dighi kwa onye nānaputa ha.

5. Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya, Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya, Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.

6. N'ihi na ajọ ihe adighi-esi n'ájá puta, Ọ bughi kwa n'ala ka ọnọdu ọjọ si epuputa;

7. Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ, Dika icheke-ọku nile nēfeli elu.

8. Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke, Chineke ka m'gēbo kwa okwum:

9. Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi; Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:

10. Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala, Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi:

11. Ido ndi di ala n'ebe di elu; Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa.

12. Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ, Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere.

13. Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.

14. N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri, Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.

15. O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha, Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.

16. Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya, Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.

17. Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba: Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.

18. N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u, Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.

19. Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi; Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.

20. N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu; B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha.

21. Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi; I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia.

22. I gāchì ihe-ike, chì kwa agu, ọchì; I gaghi-atu kwa egwu anu-ọhia nke uwa.

23. N'ihi na gi na nkume ọhia nile gādi n'ọb͕ub͕a-ndu; Gi na anu ọhia gādi kwa n'udo.

24. I gāma kwa na ulo-ikwū-gi di n'udo; I gēlekọta kwa ebe-obibi-gi, i gaghi-emehie kwa.

25. I gāma kwa na nkpuru-gi di ọtutu, Umu nke putara n'aru-gi gādi kwa ka ihe-ọkukú nke ala.

26. I gābia n'ílì n'ezib͕o agadi, Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya.

27. Le nka, ayi egwuputawo ala-ya, otú a ka ọ di; Nuru ya, gi onwe-gi mata kwa ya n'onwe-gi.

About Job Chapter 5

Read Job Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Job
Chapter: 5
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Job Chapter 5 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Job Chapter 5?

Job Chapter 5 is part of the Book of Job in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Job Chapter 5 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Job

  1. Jób Chapter 31
  2. Job Chapter 36
  3. Jób Chapter 37
  4. Jób Chapter 6
  5. Job Chapter 1
  6. Job Chapter 15
  7. Job Chapter 19

Related Chapters & Readings

  1. Aisaia Chapter 31
  2. I. Ndi-Eze Chapter 18
  3. Luk Chapter 19
  4. Abù Ọma Chapter 17
  5. Jọn Chapter 19
  6. Job Chapter 42
  7. Deuteronomi Chapter 24
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *