Read Job Chapter 33 Online
Read Job Chapter 33 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 33
Isi 33
1. Ma otú ọ di, biko, Job, nuru okwum nile, Ṅa kwa nti okwum nile.
2. Biko, le, asaghewom ọnum, Irem ekwuwo n'okpo-ọnum.
3. Okwu-ọnum nile gēkwuputa izi-ezi nke obim: Ihe eb͕ub͕ere-ọnum mara ka ha kwuworo n'idi-ọcha.
4. Mọ nke Chineke emewom, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka m'di ndu.
5. Ọ buru na i puru, zaghachim; Do okwu-gi n'usoro n'irum, guzo onwe-gi.
6. Le, mu onwem di ka i si di n'ebe Chineke nọ: Site n'urọ ka akpurum, ọbuná mu onwem.
7. Le, oké ujọm agaghi-eme ka i tua egwu nke-uku, Nbigide-akam agaghi-adi kwa arọ́ n'aru-gi.
8. N'ezie i kwuwo na ntim, Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si,
9. Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie; Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:
10. Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa, Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;
11. O nētiye ukwum abua nime ọtọsi, Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya.
12. Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi: N'ihi na Chineke di uku kari madu.
13. Gini mere i ji so Ya se okwu, Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme?
14. N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu, E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama.
15. Na nrọ, bú ọhù nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu, N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina;
16. Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu, Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,
17. Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya, Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;
18. Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù, Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.
19. Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya, Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile:
20. Nri we nāsọ ndu-ya oyi, Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi.
21. Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya; Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n'elu.
22. Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù, Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.
23. Ọ buru na mọ-ozi anọ n'akuku ya, Bú onye-nsughari, otù onye n'etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri, Igosi madu izi-ezi-ya;
24. Ọ gēme-kwa-ra ya amara, si, Dọputa ya n'irida n'olùlù, Achọtawom ihe-nb͕aputa.
25. Anu-aru-ya gādi ọhu kari nke nwata Ọ nālaghachiru ubọchi okorọbia-ya:
26. Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ; O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya: O we nyeghachi madu ezi omume-ya.
27. Ọ nābù abù n'iru madu, si, Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume, Ma ọ baghm n'ihe:
28. Ọ b͕aputawo nkpuru-obim n'igabiga ba n'olùlù, Ndum gēle kwa ìhè.
29. Le, ihe ndia nile ka Chineke nālu, Ub͕ò abua, ma-ọbu ub͕ò atọ, n'ebe madu nọ,
30. Ime ka nkpuru-obi-ya si n'olùlù lata, Ka ewe were ìhè nke ndu nye ya ìhè.
31. Job, ṅa nti, gem nti: B͕a nkiti, na mu onwem gēkwu.
32. Ọ buru na okwu adi n'ọnu-gi, zaghachim: Kwue, n'ihi na ọ dim utọ igu gi n'onye ezi omume.
33. Ọ buru na okwu adighi, gi onwe-gi gem nti: B͕a nkiti, na m'gēzi gi amam-ihe.
About Job Chapter 33
Read Job Chapter 33 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 33
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 33 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 33?
Job Chapter 33 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 33 online for free with easy chapter navigation.