Read Job Chapter 39 Online
Read Job Chapter 39 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 39
Isi 39
1. Ì mawo mb͕e ewu-ọhia nke nkume di elu ji amu nwa? Ì nāriba ama mb͕e nne-ele nāmuputa nwa?
2. Ì nāgu ọnwa ha nọzuru n'imu nwa ọnu? Ma-ọbu ì mawo mb͕e ha ji amu nwa?
3. Ha nēruru ala, muputa umu-ha, Tuzuga ihe-nb͕u-ha.
4. Aru nāma umu-ha nma, ha nētolite n'ọhia; Ha nāpu, ha adighi-alaghachikute kwa ha.
5. Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya? Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia?
6. Nke M'meworo ala ihe nādighi ka ọ buru ulo-ya, Me kwa ala bu nnú nnú ka ọ buru ebe-obibi-ya.
7. Ọ nāchì ùzù obodo ọchì, Ọ dighi-anu nbib͕o nke onye nāchi madu n'ihe-ike.
8. Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya, Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ.
9. Àtu gēkwe ibu orù-gi? Ma-ọbu ọ̀ gānọ ọnọdu-abali n'akuku ebe i nāzù anu-ulo-gi?
10. Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi? Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari?
11. Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne? Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?
12. Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi, Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi?
13. Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu; Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?
14. N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala, Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,
15. O we chezọ na ukwu gāzọpia ha, Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.
16. O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere: Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;
17. N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe, O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.
18. Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ, Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.
19. Ì nēnye inyinya idi-ike-ya? Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?
20. Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube? Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.
21. Ọ nābọ ukwu na ndagwurugwu, obi nātọ kwa ya utọ n'ike-ya: Ọ nāpu izute ihe-agha.
22. Ọ nāchì oké egwu ọchì, ma ọ dighi-atu ujọ; Ọ dighi-esi kwa n'iru mma-agha chighari azu.
23. Àkpà-àkú nēkwu wọghiri wọghiri n'elu ya, Ya na ob͕ub͕u-àmùmà nke ube, na arua.
24. Nime nmali-elu-ya na ime-nkpatu-ya o nēloda ala; Ọ dighi-ekwe kwa na ọ bu olu opi-ike.
25. Mb͕e ọ bula opi-ike ji adà udà ọ si, Ehe! Ọ bu kwa site n'ebe di anya ka ọ nānu ísì agha, Na éb͕è-elu-igwe, bú nbib͕ọ ndi-ọchi-gha, na iti-nkpu.
26. Ọ̀ bu site na nghọta-gi ka eb͕é nēfego n'elu, B͕asa kwa nkù-ya n'ebe Ndida di?
27. Ọ̀ bu n'okwu-ọnu-gi ka ugo nēfeli elu, Ma-ọbu me akwu-ya ka ọ di elu?
28. N'elu nkume di elu ka o nēbi, nọ kwa ọnọdu-abali, N'elu ọnu nkume di elu na ebe ewusiri ike.
29. Site n'ebe ahu ka o nyoputaworo ihe-oriri; Anya-ya abua nēsi n'ebe di anya legide ya.
30. Umu-ya nāmicha kwa ọbara: Ọzọ, ebe ndi eb͕uru eb͕u di, n'ebe ahu ka ọ nọ.
About Job Chapter 39
Read Job Chapter 39 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 39
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 39 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 39?
Job Chapter 39 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 39 online for free with easy chapter navigation.