Emos Chapter 9

For English

Read Emos Chapter 9 Online

Read Emos Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Emos in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Emos and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Emos 9

Isi 9

1. Ahurum Onye-nwe-ayi, ka Ọ nēguzo Onwe-ya n'akuku ebe-ichu-àjà-Ya: O we si, Tie isi-ogidi nile, ka nbata-uzọ nile we me nkpatu: tijisie ha n'isi ha nile; ma ndi-ikpe-azu nime ha ka M'gēji mma-agha b͕ue: onye-ha nke nāb͕alaga ab͕alaga agaghi-ab͕alaga; ọzọ, onye-ha nke nāb͕apu ab͕apu agaghi-ewepuga onwe-ya.

2. Ọ buru na ha egwubà n'ala-mọ, site n'ebe ahu ka akam gēwere ha; ọ buru kwa na ha arigorue elu-igwe, M'gēme ka ha si n'ebe ahu ridata.

3. Ọ buru kwa na ha ezobe onwe-ha n'elu Kamel, n'ebe ahu ka M'gāchọputa ha were ha; ọ buru kwa na ezonari ha anyam abua n'ala oké osimiri, site n'ebe ahu ka M'gēnye agwọ ahu iwu, o we ta ha.

4. Ọ buru kwa na ha ala nime ndọta-n'agha n'iru ndi-iro-ha, site n'ebe ahu ka M'gēnye mma-agha iwu, o we b͕ue ha: M'gātukwasi kwa ha anyam abua ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha ezi ihe.

5. Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bu Onye nēmetu ala, o we b͕aze, ndi nile ndi bi nime ya ewe rue újú; ọ gērujucha kwa dika osimiri Nail, we tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt;

6. Onye nēwu ime-ulo-elu-Ya nile n'elu-igwe, ma mbara-ígwé-Ya, n'elu uwa ka Ọ tọworo ntọ-ala-ya; Onye nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha n'ala; Jehova bu aha-Ya.

7. Ọ̀ bughi ndi di ka umu ndi Etiopia ka unu burum, unu umu Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi Israel ka M'meworo ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, na ndi Filistia site na Kaftoa, na ndi Siria site na Kia?

8. Le, anya abua nke Onye-nwe-ayi Jehova di n'aru ala-eze a nke juputara na nmehie, M'gēkpochapu kwa ya n'elu uwa; nání na M'gaghi-ekpochapusi ulo Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

9. N'ihi na, le, Mu onwem gaje inye iwu, yọchaghari ulo Israel iru na azu n'etiti mba nile, dika esi ayọchaghari ọka nime nyọ, ma ọ dighi otù nkpuru-ọka gāda n'ala.

10. Site na mma-agha ka ndi-nmehie nile nke ndim gānwu, ndi nāsi, Ihe ọjọ ahu agaghi-erute ayi aru, ọ gaghi-abia kwa n'iru ayi n'akuku ọ bula.

11. N'ubọchi ahu ka M'gēguzobe ulo-ntu Devid ọtọ, bú nke dara ada, M'gēmechi kwa ntipú-ya nile; ọ bu kwa ebe-ya nile kwaturu akwatu ka M'gēguzobe ọtọ, wulie ya dika n'ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga;

12. ka ha we nweta ndi Edom fọduru, na mba nile ndi akpọkwasiri aham; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, bú Onye nēme nka.

13. Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e onye-plough gēkwudo onye nēbì ọka, onye-nzọcha-nkpuru-vine gēkwudo kwa onye nāgha nkpuru-ọghigha; ugwu nile gēme ka manya-vine utọ nābusa, ugwu ntà nile gāb͕aze kwa.

14. M'gēme kwa ka ndim adọtara n'agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọb͕ọrọ n'efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ṅua manya-ha; ha gēme kwa ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha.

15. M'gāku kwa ha n'elu ala-ha, agaghi-eropu kwa ha ọzọ n'ala-ha nke M'nyeworo ha; otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, siri.

About Emos Chapter 9

Read Emos Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Emos in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Emos
Chapter: 9
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Emos. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Emos Chapter 9 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Emos Chapter 9?

Emos Chapter 9 is part of the Book of Emos in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Emos Chapter 9 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Emos Chapter 1
  5. Ilu Chapter 12
  6. Jenesis Chapter 13
  7. Eklisiastis Chapter 2

Explore More from emos

  1. Emos Chapter 4
  2. Emos Chapter 6
  3. Emos Chapter 8
  4. Emos Chapter 1
  5. Emos Chapter 2
  6. Emos Chapter 7
  7. Emos Chapter 5

Related Chapters & Readings

  1. Nkpugh Chapter 17
  2. Abù Ọma Chapter 80
  3. Matiu Chapter 21
  4. Levitikọs Chapter 7
  5. I. Samuel Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 11
  7. Jenesis Chapter 14
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *