Read Job Chapter 16 Online
Read Job Chapter 16 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 16
Isi 16
1. Job we za, si,
2. Anuwom ọtutu ihe dika ihe ndia: Ndi-nkasi-obi nēweta ọnọdu ọjọ ka unu nile bu.
3. Òkwu nke bu nání ifufe gēnwe ọgwugwu? Ma-ọbu gini nēme gi ka i di irè, na i nāza okwu?
4. Ka mu onwem kwu kwa okwu dika unu; Ọ buru na nkpuru-obi-unu adi n'ọnọdu nkpuru-obim, M'gēnwe ike ijikọta okwu imegide unu, Na ifufe isim imegide unu.
5. M'gēwere ọnum b͕a unu ume, Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu.
6. Ọ buru na ekwuem, adighi-eb͕ochi ihe-nb͕um: Ma ọ buru na arapum, gini gēsi n'arum la?
7. Otú ọ di, ub͕u a O mewo ka ike gwum: I mewo ka nzukọm nile ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.
8. I we jisiem ike, ọ ghọwo ihe-àmà megidem: Ọtita-arum we nēbili imegidem, Ọ nāzam n'iru.
9. Iwe-ya adọkawom O we kpọm asì; Ọ takwasiwom ikekere ezé-Ya: Onye-nkpab͕um nāchichapu anya-Ya n'arum.
10. Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Were ita-uta tiem aka na ǹtì: Ha nāchikọzu onwe-ha n'otù imegidem.
11. Chineke nēmechibidom uzọ nye ndi ajọ omume, N'aka ndi nēmebi iwu ka Ọ nātubàkwam.
12. Anọm n'udo, O we mebiem; Ọzọ, O jidewo olum, piajisiam, Me ka m'biliere Onwe-ya ibu ihe O dotara ib͕a àkú.
13. Àkú-Ya nile dim buruburu, Ọ nāb͕awa akurum, Ọ dighi-enwe kwa ọmiko n'arum; Ọ nāwusi òlùlùm n'ala.
14. O nētipúm ntipú n'elu ntipú-ibe-ya; Ọ nāb͕akwasim dika dike.
15. Ákwà-nkpe ka m'dukọtaworo n'elu akpukpọ-arum, Turughari mpim n'ájá.
16. Irum nācha ọbara-ọbara site n'ikwa-ákwá, Na mbubere-anyam ka onyinyo ọnwu di kwa;
17. Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam, Ekperem di kwa ọcha.
18. Ala, ekpuchila ọbaram, Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.
19. Ọbuná ub͕u a, le, n'elu-igwe ka Onye-àmàm nọ, Onye nēkwurum nọ kwa n'ebe di elu.
20. Ndi-eyìm bu ndi nākwam emò: Ma ọ bu n'ebe Chineke nọ ka anyam nātusisi anya-miri;
21. Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka, Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka.
22. N'ihi na arọ ole-na-ole gābia, M'we je n'uzọ m'gaghi-alaghachi.
About Job Chapter 16
Read Job Chapter 16 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 16
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 16 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 16?
Job Chapter 16 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 16 online for free with easy chapter navigation.