Read Job Chapter 12 Online
Read Job Chapter 12 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Job 12
Isi 12
1. Job we za, si,
2. N'ezie unu onwe-unu bu ndi bu ihe, Unu na amam-ihe gānwukọ n'otù.
3. Enwe-kwa-ram obi dika unu; Mu onwem abughi onye dara ada kari unu: Ma ònye ka ọ bu nke ihe dika ndia nādighi n'aka?
4. Onye bu ihe-ọchì nke madu-ibe-ya ka m'bu, Bú onye nākpọku Chineke, O we za ya: Ihe-ọchì ka onye ezi omume nke zuru okè bu.
5. Nleda diri ọdida n'èchìchè onye nọ jū; Edoziwo ya nye ndi ukwu-ha nāb͕uchapu ab͕uchapu.
6. Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n'udo, Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe; Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n'aka-ya.
7. Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe, Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi:
8. Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe; Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.
9. Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile, Na aka Jehova emewo nka?
10. Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya, Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.
11. Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu? Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?
12. Nime ndi kara nká ka amam-ihe di, N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.
13. N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di; Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.
14. Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ; Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.
15. Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ; Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.
16. N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di; O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.
17. Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha, Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.
18. Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo, We ke ihe-ọkiké n'úkwù-ha.
19. Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha, Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.
20. Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa.
21. Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha, Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.
22. Ọ nēsi n'ọchichiri kpughepu ihe di omimi, We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.
23. Ọ nēme ka mba di uku, Ọ nēme kwa ka ha la n'iyì: Ọ nāb͕asa mba, nēdu kwa ha.
24. Ọ nēwezuga obi ndi-isi nke ndi uwa, We me ka ha waghari n'ebe tọb͕ọrọ n'efu ebe uzọ nādighi.
25. Ha nāsọghari ìsì n'ọchichiri nēnweghi ìhè, O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.
About Job Chapter 12
Read Job Chapter 12 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Job
Chapter: 12
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Job Chapter 12 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Job Chapter 12?
Job Chapter 12 is part of the Book of Job in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Job Chapter 12 online for free with easy chapter navigation.