Ilu Chapter 19

For English

Read Ilu Chapter 19 Online

Read Ilu Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 19

Isi 19

1. Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'okwu, onye bu kwa onye-nzuzu.

2. Ọzọ, mb͕e nkpuru-obi nēnweghi ihe-ọmuma ọ dighi nma; Onye ukwu-ya nēme ngwa nēhie uzọ.

3. Uche b͕agọrọ ab͕agọ nke madu nēkpù uzọ-ya iru; Ọ bu kwa imegide Jehova ka obi-ya di ọku.

4. Àkù nātukwasiri madu ọtutu eyì: Ma onye nēnweghi ihe, anēkewapu ya n'ebe eyì-ya nọ.

5. Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ; Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume agaghi-ewepuga onwe-ya.

6. Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua: Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì.

7. Umu-nne nile nke ob͕eye nākpọ ya asì: Ǹdi-eyì-ya gēsi aṅa ghara inọ ya n'ebe di anya kari! Ọ nāb͕aso okwu-ọnu di iche iche nke nābughi ihe.

8. Onye nēnweta obi amam-ihe nāhu nkpuru-obi-ya n'anya: Onye nēdebe nghọta gāchọta ezi ihe.

9. Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ; Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n'iyì.

10. Idi-pekepeke amaghi onye-nzuzu nma; Ò gēsi kwa aṅa ma orù nma ichi ndi-isi?

11. Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ; Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.

12. Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu; Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di.

13. Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu: Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu.

14. Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu: Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n'aka.

15. Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu; Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.

16. Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya: Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu.

17. Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu, Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.

18. Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di; Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.

19. Onye oké ọnuma ganāra nra: N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.

20. Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti, Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.

21. Ọtutu èchìchè di n'obi madu; Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.

22. Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya: Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.

23. Egwu Jehova nēdubà na ndu: Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju; Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.

24. Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa, Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya.

25. Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche: Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma.

26. Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga, Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere.

27. Nwam, rapu inu idọ-aka-na-nti Nke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari.

28. Onye-àmà nke jọb͕uru onwe-ya nākwa ikpé emò: Ọzọ, ọnu ndi nēmebi iwu nēloda ajọ ihe.

29. Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche, Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.

About Ilu Chapter 19

Read Ilu Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 19
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 19 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 19?

Ilu Chapter 19 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 19 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 20
  2. Ilu Chapter 3
  3. Ilu Chapter 26
  4. Ilu Chapter 12
  5. Ilu Chapter 8
  6. Ilu Chapter 13
  7. Ilu Chapter 25

Related Chapters & Readings

  1. Levitikọs Chapter 13
  2. Ezra Chapter 4
  3. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 4
  4. II. Ihe Emere Chapter 25
  5. I. Samuel Chapter 12
  6. Levitikọs Chapter 10
  7. Emos Chapter 2
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *