Ilu Chapter 5

For English

Read Ilu Chapter 5 Online

Read Ilu Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 5

Isi 5

1. Nwam, ṅa nti n'amam-ihem; Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam:

2. Ka i we debe ìzùzù di iche iche, Ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi we chebe kwa ihe-ọmuma.

3. N'ihi na eb͕ub͕ere-ọnu nke nwayi nābughi nwunye-gi nābusi manu-aṅu, Ihe kwọrọ murumuru kari manu ka okpo-ọnu-ya di kwa:

4. Ma ikpe-azu-ya nēlu ilu dika wormwood, Ọ di nkọ dika mma-agha iru abua.

5. Ukwu-ya abua nārida n'ọnwu; Ala-mọ ka nzọ-ukwu-ya nile nējidesi ike;

6. Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari: Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha.

7. Ma ub͕u a, umum, gēnum nti, Unu esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-unu.

8. Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ, Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso:

9. Ka i we ghara inye ndi ọzọ ebube-gi, Ka i we ghara kwa inye onye nēnweghi obi-ebere arọ-gi nile:

10. Ka afọ we ghara iju ndi nābughi ndi nke gi n'ume-gi; Ka ihe nile i dọb͕uru onwe-gi n'ọlu inweta we ghara kwa idi n'ulo onye nābughi nke gi;

11. I we sua udè n'ikpe-azu-gi, Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi,

12. I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku, Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;

13. Egeghkwam nti n'olu ndi-ozizim, Ọ bughi kwa n'ebe ndi nēzím ihe nọ ka m'tọworo ntim n'ala!

14. Ọ fọduru ihe ntà ka m'nọzue n'ihe ọjọ nile N'etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem.

15. Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi, Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi.

16. Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí? Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi?

17. Ka ha diri nání gi onwe-gi, Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha.

18. Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi; Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia.

19. Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma, Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile; Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile.

20. Ma n'ìhi gini ka i gēji nwayi nābughi nwunye-gi waghari, nwam? N'ìhi gini ka i gāb͕aku nwayi nābughi nwunye-gi obi?

21. N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di, Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.

22. Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu, Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike.

23. Onye ahu gānwu nānaraghi idọ-aka-na-nti; Ọ bu kwa n'iba-uba nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ka ọ nāwaghari.

About Ilu Chapter 5

Read Ilu Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 5
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 5 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 5?

Ilu Chapter 5 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 5 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 3
  2. Ilu Chapter 31
  3. Ilu Chapter 20
  4. Ilu Chapter 1
  5. Ilu Chapter 27
  6. Ilu Chapter 4
  7. Ilu Chapter 21

Related Chapters & Readings

  1. Hosea Chapter 13
  2. Jeremaia Chapter 21
  3. Ọpupu Chapter 2
  4. I. Ihe Emere Chapter 8
  5. Ezikiel Chapter 35
  6. Jeremaia Chapter 42
  7. Abù Ọma Chapter 108
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *