Ilu Chapter 26

For English

Read Ilu Chapter 26 Online

Read Ilu Chapter 26 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 26

Isi 26

1. Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi, Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu.

2. Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya, Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.

3. Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu, Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu.

4. Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi.

5. Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.

6. Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miri Ka onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu.

7. Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe: Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu.

8. Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume, Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.

9. Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè, Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.

10. Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile, Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.

11. Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.

12. Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.

13. Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ; Ọdum di n'amá.

14. Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya, Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya.

15. Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa; Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya.

16. Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-ya Kari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.

17. Onye nējide nkita na nti ka ọ bu, Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya.

18. Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku, Na àkú, na ọnwu;

19. Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya, We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu?

20. Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu: Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju.

21. Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di; Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.

22. Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku, Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.

23. Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọcha Ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu.

24. Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua, Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ:

25. Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya; N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya.

26. Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya, Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya.

27. Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà: Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru.

28. Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì; Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda.

About Ilu Chapter 26

Read Ilu Chapter 26 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 26
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 26 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 26?

Ilu Chapter 26 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 26 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 16
  2. Ilu Chapter 31
  3. Ilu Chapter 7
  4. Ilu Chapter 2
  5. Ilu Chapter 14
  6. Ilu Chapter 13
  7. Ilu Chapter 1

Related Chapters & Readings

  1. Deuteronomi Chapter 13
  2. Zekaraia Chapter 10
  3. Ezikiel Chapter 24
  4. Abù Ọma Chapter 110
  5. Luk Chapter 14
  6. Jeremaia Chapter 16
  7. Jemes Chapter 4
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *