Ilu Chapter 27

For English

Read Ilu Chapter 27 Online

Read Ilu Chapter 27 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 27

Isi 27

1. Anyala isi bayere echi; N'ihi na i maghi ihe chi gābọ.

2. Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi; Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi.

3. Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú; Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua.

4. Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa; Ma ònye gēguzo n'iru ekworo?

5. Ọ di nma, bú iba-nba n'ìhè, Kari ihu-n'anya nke ezobeworo ezobe.

6. Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ob͕ub͕u-mma nile nke onye nāhu gi n'anya bu: Ma ihe riri nne ka nsutu-ọnu nke onye nākpọ gi asì bu.

7. Nkupuru-obi nke rijuworo afọ nāzọda manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi: Ma ihe nile ọ bula nke nēlu ilu nātọ nkpuru-obi agu nāgu utọ.

8. Dika nnunu nke nēsi n'akwu-ya efefu, Otú a ka madu di nke nēsi n'ọnọdu-ya akpafu.

9. Manu na ihe-nsure-ọku nke nēsi ísì utọ nēme ka obi ṅuria: Otú a ka utọ eyì madu di nke sitere na ndum-ọdu nke nkpuru-obi.

10. Arapula eyì-gi na eyì nna-gi; Abà-kwa-la n'ulo nwa-nne-gi n'ubọchi nhuju-anya-gi: Ọ di nma, bú ab͕ata-obi nke nọ nso, Kari nwa-nne nke nọ n'ebe di anya.

11. Mara ihe, nwam, we me ka obim ṅuria, Ka m'we zaghachi onye nātam uta okwu.

12. Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya: Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.

13. Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe; N'ọnọdu nwanyi nābughi nwunye-ya nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.

14. Onye ji oké olu agọzi madu-ibe-ya, nke nēbili n'isi-ututu ime ya, Nkọcha ka agāgu ngọzi ahu nye ya.

15. Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n'ubọchi oké miri-ozuzo, Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri:

16. Onye nēzobe ya ezobewo ifufe, Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute.

17. Ígwè nāmucha ígwè; Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.

18. Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya; Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.

19. Dika miri si eme ka iru hu iru, Otú a ka obi nēme ka madu hu madu.

20. Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì; Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu.

21. Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo, Anānwa kwa onye ọ bula site n'otuto-ya.

22. Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu, Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya.

23. Mara iru igwè ewu na aturu-gi nke-ọma, Tukwasi obi-gi n'igwè anu-ulo-gi nile:

24. N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka àkù di; Okpu-eze kwa, ọ̀ nādiru ọb͕ọ nile?

25. Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu, Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile.

26. Umu-aturu diri uwe-oyiyi-gi, Ọnu-ahia nke ọhia-gi ka ewu bu kwa:

27. Ara ewu gēzu-kwa-ra nri-gi, zu-kwa-ra nri ulo-gi; Buru kwa ihe gēdebe umu-ab͕ọghọ-gi ndu.

About Ilu Chapter 27

Read Ilu Chapter 27 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 27
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 27 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 27?

Ilu Chapter 27 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 27 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 14
  2. Ilu Chapter 19
  3. Ilu Chapter 10
  4. Ilu Chapter 5
  5. Ilu Chapter 1
  6. Ilu Chapter 2
  7. Ilu Chapter 23

Related Chapters & Readings

  1. Ezikiel Chapter 31
  2. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 4
  3. Deuteronomi Chapter 16
  4. Deuteronomi Chapter 28
  5. II. Samuel Chapter 1
  6. I. Ndi-Eze Chapter 21
  7. Job Chapter 18
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *