Ilu Chapter 29

For English

Read Ilu Chapter 29 Online

Read Ilu Chapter 29 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 29

Isi 29

1. Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike, N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.

2. Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri: Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.

3. Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria: Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì.

4. Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo: Ma onye nānara onyinye nākwada ya.

5. Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọ Nāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.

6. Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di: Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.

7. Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike: Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.

8. Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo: Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.

9. Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe, Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.

10. Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì: Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya.

11. Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè: Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.

12. Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha, Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.

13. Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo: Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova.

14. Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi, Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.

15. Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe: Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.

16. Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari: Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha.

17. Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike; E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.

18. Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta: Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma.

19. Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti: N'ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza.

20. Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n'okwu-ya nile? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.

21. Onye zutọworo orù-ya site na nwata, N'ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa.

22. Onye-iwe nākpali ise-okwu, Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.

23. Npako madu gēme ka ọ di ala: Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.

24. Onye ya na onye-ori nēkekọ ihe nākpọ nkpuru-obi ya onwe-ya asì: Ọb͕ub͕a-iyi ka ọ nānu, ma ọ dighi-egosi ihe ọ bula.

25. Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.

26. Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi: Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia.

27. Ihe-árú n'anya ndi ezi omume ka onye ajọ omume bu: Ọzọ, ihe-árú n'anya onye nēmebi iwu ka onye ziri ezi n'uzọ-ya bu.

About Ilu Chapter 29

Read Ilu Chapter 29 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 29
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 29 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 29?

Ilu Chapter 29 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 29 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 21
  2. Ilu Chapter 28
  3. Ilu Chapter 3
  4. Ilu Chapter 18
  5. Ilu Chapter 11
  6. Ilu Chapter 7
  7. Ilu Chapter 4

Related Chapters & Readings

  1. Jenesis Chapter 30
  2. Abù Ọma Chapter 116
  3. Emos Chapter 5
  4. I. Ihe Emere Chapter 14
  5. Job Chapter 15
  6. Abù Ọma Chapter 128
  7. Job Chapter 13
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *