Ilu Chapter 12

For English

Read Ilu Chapter 12 Online

Read Ilu Chapter 12 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 12

Isi 12

1. Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya: Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.

2. Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ: Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.

3. Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.

4. Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya: Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.

5. Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé: Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ.

6. Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara: Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha.

7. Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa: Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.

8. Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.

9. Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù, Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya.

10. Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya: Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.

11. Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.

12. Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru.

13. Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di: Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.

14. Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n'ezi ihe: Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya.

15. Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya: Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu.

16. Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya: Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.

17. Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume, Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ.

18. O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha: Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.

19. Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi: Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di.

20. Aghughọ di n'obi ndi nēchèputa ihe ọjọ: Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù.

21. Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume: Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n'ihe ọjọ.

22. Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu: Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.

23. Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ.

24. Aka ndi di nkọ gāchi achi: Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè.

25. Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala; Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.

26. Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ: Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.

27. Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá: Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ.

28. N'uzọ ezi omume ka ndu di; Ọzọ, n'uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.

About Ilu Chapter 12

Read Ilu Chapter 12 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 12
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 12 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 12?

Ilu Chapter 12 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 12 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Jenesis Chapter 13
  5. Emos Chapter 1
  6. Eklisiastis Chapter 2
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 28
  2. Ilu Chapter 18
  3. Ilu Chapter 5
  4. Ilu Chapter 6
  5. Ilu Chapter 20
  6. Ilu Chapter 7
  7. Ilu Chapter 29

Related Chapters & Readings

  1. Job Chapter 11
  2. Joshua Chapter 1
  3. Abù Ọma Chapter 96
  4. Nkpugh Chapter 22
  5. Abù Ọma Chapter 105
  6. Joshua Chapter 24
  7. Esta Chapter 1
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *