Ilu Chapter 16

For English

Read Ilu Chapter 16 Online

Read Ilu Chapter 16 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 16

Isi 16

1. Madu nwe ido obi n'usoro: Ma n'aka Jehova ka ọziza ire sitere.

2. Uzọ nile nke onye ọ bula di ọcha n'anya-ya: Ma Onye nātùzi mọ nile nke madu ka Jehova bu.

3. Turu ọlu-gi nile rue Jehova aru, Èchìchè-gi nile ewe guzosie ike.

4. Ihe nile ka Jehova kpuru n'ihi Onwe-ya: E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu.

5. Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu: Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

6. Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume: Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.

7. Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ, Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.

8. Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume, Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.

9. Obi madu nēchè uzọ-ya: Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.

10. Ọjuju-ase di n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze: Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu.

11. Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova: Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu.

12. Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu: N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.

13. Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu; Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya.

14. Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu: Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.

15. N'ìhè iru eze ka ndu di; Mb͕e ihe madu nātọ ya utọ, ọ di ka igwe-oji nke miri-ozuzo ikpe-azu.

16. Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma! Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha!

17. Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.

18. N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.

19. Ọ di nma inwe mọ di ala n'etiti ndi ewedara n'ala, Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n'agha.

20. Onye nwere uche n'okwu Chineke gāchọta ezi ihe: Ọzọ, onye nātukwasi Jehova obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.

21. Onye obi-ya mara ihe, agākpọ ya onye-nghọta: Ọzọ, utọ eb͕ub͕ere-ọnu nātukwasiri nmuta ihe.

22. Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n'ebe ndi-nwe-ya nọ: Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ.

23. Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche, Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta.

24. Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu, Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n'ọria.

25. Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.

26. Ọchichọ-nkpuru-obi nke onye nādọb͕u onwe-ya n'ọlu adọb͕uworo ya onwe-ya n'ọlu; N'ihi na ọnu-ya erugidewo ya.

27. Onye jọb͕uru onwe-ya nēgwuputa ihe ọjọ: Ọ bu kwa n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka ihe dika ọku nāru aru di.

28. Onye nāb͕akuta Chineke azu nēzisa ise-okwu: Ọzọ, onye nēkwu okwu-azu nēkewa ezi eyì.

29. Onye nēme ihe-ike nārà madu-ibe-ya urà, Nēme kwa ka o je ije n'uzọ nādighi nma.

30. Onye nātachi anya-ya abua ichè èchìchè ib͕akuta Chineke azu, Onye nātabi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, o mezuwo ihe ọjọ.

31. Okpu-eze nke mara nma ka isi-awọ bu, N'uzọ ezi omume ka agāhu ya.

32. Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike: Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n'agha.

33. Anēfe nzà, Ma n'aka Jehova ka ikpé-ya nile sitere.

About Ilu Chapter 16

Read Ilu Chapter 16 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 16
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 16 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 16?

Ilu Chapter 16 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 16 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 28
  2. Ilu Chapter 10
  3. Ilu Chapter 1
  4. Ilu Chapter 3
  5. Ilu Chapter 19
  6. Ilu Chapter 7
  7. Ilu Chapter 25

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 96
  2. Esta Chapter 3
  3. Eklisiastis Chapter 9
  4. Joshua Chapter 24
  5. Zekaraia Chapter 6
  6. Levitikọs Chapter 14
  7. Ilu Chapter 21
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *