Ilu Chapter 30

For English

Read Ilu Chapter 30 Online

Read Ilu Chapter 30 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ilu 30

Isi 30

1. Okwu Agua nwa Jake; ibu eboro ya. Ihe nke si n'ọnu nwoke ahu putara Itiel, ọbuná Itiel na Ukal.

2. N'ezie anu-ọhia ka m'bu kari onye ọ bula, Ọ dighi kwa nghọta madu m'nwere

3. Amutaghkwam amam-ihe, Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m'mara.

4. Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida? Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua? Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?

5. Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo: Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya.

6. Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile, Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha.

7. Ihe abua ka m'riọworo Gi; Ajulam ha tutu mu anwua:

8. Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n'ebe m'nọ: Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù; Me ka m'rie nri rurum:

9. Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ.

10. Ekpèla orù ikpè n'iru onye-nwe-ya, Ka o we ghara ikọcha gi, ikpé ewe ma gi.

11. Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha, Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.

12. Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha, Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.

13. Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku! Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.

14. Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu, Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.

15. Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye. Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju, E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo:

16. Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà; Na ala afọ miri nējughi; Na ọku nke nāsighi, O b͕owo.

17. Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya.

18. Ihe atọ di nke karirim ighọta, E, anọ nke m'nāmagh:

19. Uzọ ugo n'elu-igwe; Uzọ agwọ n'elu oké nkume; Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri; Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ.

20. Otú a ka uzọ nwayi nākwa iko di; O riwo ihe, hicha kwa ọnu-ya, Si, Emeghm ajọ ihe ọ bula.

21. N'okpuru ihe atọ ka uwa maworo jijiji, N'okpuru ihe anọ kwa, nke ọ nāpughi iburu:

22. N'okpuru orù mb͕e ọ nāghọ eze; Na onye-nzuzu mb͕e nri nēju ya afọ;

23. N'okpuru nwayi anākpọ asì mb͕e ọ nwere di; Na nwanyi nēje ozi mb͕e ọ nēketa ihe nwanyi-nwe-ya.

24. Ihe anọ di nke di ntà n'elu-uwa, Ma ihe ahu mara ihe nke-uku:

25. Danda bu ndi nādighi ike, Ma ha nēdozi nri-ha na mb͕e okpom-ọku;

26. Coney bu ndi nēnweghi ume, Ma ha nēdo ulo-ha na nkume di elu;

27. Ọ dighi eze igurube nwere, Ma mb͕e ha nāpu ha nēkè onwe-ha n'usu, ha nile;

28. Nche-ulo nēji aka-ya nile agigado, Ma ihe ahu di n'ulo uku eze.

29. Ihe atọ di nke nāzọ ukwu nke-ọma, E, anọ di nke nēje ije nke-ọma:

30. Ọdum, nke bu dike n'etiti anu nile, Ọ dighi-esi kwa n'iru ihe ọ bula laghachi azu;

31. Inyinya-agha; na nkpi; Na eze, nke nbili megide ya nādighi.

32. Ọ buru na i zuzuwo nzuzu n'ibuli onwe-gi, Ma-ọbu ọ buru na i zubewo nzube ọjọ, Tukwasi aka-gi n'ọnu-gi.

33. N'ihi na opìpì miri-ara-ehi nēweputa miri-ara raru araru, Ọzọ, opìpì imi nēweputa ọbara: Otú a ọpìpì iwe nēweputa ise-okwu.

About Ilu Chapter 30

Read Ilu Chapter 30 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ilu
Chapter: 30
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ilu Chapter 30 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ilu Chapter 30?

Ilu Chapter 30 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ilu Chapter 30 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Ilu

  1. Ilu Chapter 1
  2. Ilu Chapter 18
  3. Ilu Chapter 15
  4. Ilu Chapter 6
  5. Ilu Chapter 17
  6. Ilu Chapter 22
  7. Ilu Chapter 28

Related Chapters & Readings

  1. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 15
  2. Ọnu-Ọgugu Chapter 18
  3. II. Samuel Chapter 9
  4. Nehemaia Chapter 9
  5. Daniel Chapter 6
  6. I. Ndi Kọrint Chapter 7
  7. Ezikiel Chapter 9
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *