Read Ilu Chapter 24 Online
Read Ilu Chapter 24 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ilu and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ilu 24
Isi 24
1. Ekwosola ndi ọjọ ekworo, Achọsi-kwa-la ike inọ n'etiti ha:
2. N'ihi na ipunara-madu-ihe ka obi-ha nātughari, Okwu nmeb͕u ka eb͕ub͕ere-ọnu-ha nēkwu.
3. Amam-ihe ka eji ewu ulo; Ọ bu kwa nghọta ka eji eme ka o guzosie ike:
4. Site kwa n'ihe-ọmuma ka ime-ulo-ya nile nējuputa N'àkù nile di oké ọnu-ahia di kwa utọ.
5. Onye mara ihe di ike; E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume.
6. N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha: Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.
7. Amam-ihe adikara onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ elu: Ọ dighi-asaghe ọnu-ya n'ọnu-uzọ-ama.
8. Onye nēchè ime ihe ọjọ, Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile.
9. Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie: Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu.
10. Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu, Ike-gi pere npe.
11. Naputa ndi anāchigara ọnwu, Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.
12. Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a: Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta? Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama? Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di?
13. Nwam, racha manu-aṅu, n'ihi na ọ di nma; Ya na manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi, nke nātọ okpo-ọnu-gi utọ:
14. Mara na otù a ka amam-ihe diri nkpuru-obi-gi: Ọ buru na i chọtawo ya, ọdi-n'iru gādi kwa, Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
15. Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume; Apunarala ya ebe-izu-ike-ya:
16. N'ihi na ub͕ò asa ka onye ezi omume nāda, bili kwa ọzọ: Ma ndi nēmebi iwu nāsu ngọngọ n'ihe ọjọ.
17. Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda, Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ:
18. Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n'anya-Ya, O we me ka iwe-Ya si n'aru ya laghachi.
19. Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ; Ekwosola ndi nēmebi iwu ekworo.
20. N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
21. Nwam, tua egwu Jehova na eze: Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo:
22. N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili; Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya?
23. Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe. Imata iru madu n'ikpé adighi nma.
24. Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu; Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe:
25. Ma ndi nābara ya nba ka ọ gādi utọ, Ọ bu kwa ndi ahu ka ezi ngọzi gābiakwasi.
26. O ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua esutu ọnu, Bú onye nāza okwu ziri ezi.
27. Dozie ije-ozi-gi n'èzí, Jikere-kwa-ra ya onwe-gi n'ọhia; Emesia wu kwa ulo-gi.
28. Abula onye-àmà megide madu-ibe-gi n'efu; Ì gēji kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua rafu?
29. Asila, Dika o siri mem, otú a ka m'gēme ya; M'gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di.
30. N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara, Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ;
31. Ma, le, o púchiri n'ogwu, Akuba kpuchiri iru-ya, Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya.
32. Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya: Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti.
33. Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala:
34. Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe; Ihe-ukọ-gi kwa, dika nwoke ji ọta.
About Ilu Chapter 24
Read Ilu Chapter 24 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ilu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ilu
Chapter: 24
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ilu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ilu Chapter 24 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ilu Chapter 24?
Ilu Chapter 24 is part of the Book of Ilu in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ilu Chapter 24 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Eklisiastis Chapter 2