Jemes Chapter 2

For English

Read Jemes Chapter 2 Online

Read Jemes Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jemes in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jemes and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Jemes 2

Isi 2

1. Umu-nnam, unu enwela okwukwe nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Onye-nwe ebube, n'ile-madu-anya-n'iru.

2. N'ihi na asi na otù nwoke nke yiri nb͕a-aka ọla-edo na uwe mara nma nke-uku bata na nzukọ-unu, ma asi na otù ob͕eye nke yiri uwe ruru inyi bata kwa;

3. ọ buru kwa na unu ele onye ahu nke nēyi uwe mara nma nke-uku anya, si, Gi onwe-gi nọdu ala n'ebe a nke-ọma; unu we si ob͕eye ahu, Gi onwe-gi guzo n'ebe a, ma-ọbu nọdu ala n'okpuru ihe-nb͕akwasi-ukwum;

4. ùnu enweghi obi abua nime onwe-unu, ùnu aghọghi kwa ndi-ikpé nēchè èchìchè ọjọ?

5. Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya?

6. Ma unu onwe-unu mere ob͕eye ahu ihe-ihere. Ǹdi-ọgaranya adighi-emeso unu dika ha bu ndi-nwe-unu? ọ̀ bughi kwa ha onwe-ha nādọkpuru unu ga ulo ikpé?

7. Ọ̀ bughi ha onwe-ha nēkwulu aha ọma ahu nke aguru unu?

8. Otú ọ di, ọ buru na unu edebezu iwu nke Eze-ayi, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si kwu, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, unu nēme nke-ọma:

9. ma ọ buru na unu ele madu anya n'iru, ọ bu nmehie ka unu nēme, n'ihi na iwu ahu nātu unu nmehie-unu n'anya dika ndi-njehie.

10. N'ihi na onye ọ bula nke gēdebe iwu ahu dum, ma ọ su ngọngọ n'otù ihe, emewo ya ka ọ buru onye ikpé iwu ahu nile mara.

11. N'ihi na Onye ahu Nke siri, Akwala iko, Ọ si-kwa-ra, Eb͕ula madu. Ma ọ buru na i kwaghi iko, ma i nēb͕u madu, i ghọwo onye-njehie iwu.

12. Nēkwunu otú a, nēme-kwa-nu otú a, dika ndi agaje iwere iwu nke inwe-onwe-onye kpe unu ikpé.

13. N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.

14. Ùrù gini ka ọ bara, umu-nnam, ma ọ buru na onye ọ bula asi na o nwere okwukwe, ma o nweghi ọlu? òkwukwe ahu puru izọputa ya?

15. Ọ buru na nwa-nna-nwoke ma-ọbu nwa-nna-nwanyi b͕a ọtọ, nēnweghi kwa ihe-oriri gēzuru ya kwa-ubọchi,

16. ma otù onye n'etiti unu si ha, Labanu n'udo, nyanu ọku, riju-kwa-nu afọ; ma unu enyeghi ha ihe nākpa aru-ha; ùrù gini ka ọ bara?

17. Ọbuná otú a okwukwe, ma ọ buru na o nweghi ọlu, ọ bu ihe nwuru anwu n'onwe-ya.

18. Ma otù onye gāsi, Gi onwe-gi nwere okwukwe, mu onwem nwe-kwa-ra ọlu: gosim okwukwe-gi ma ọlu-gi adighi ya, mu onwem gēsite kwa n'ọlum gosi gi okwukwem.

19. Gi onwe-gi kwere na Chineke bu otù; i nēme nke-ọma: ndi-mọ ọjọ kwe-kwa-ra, we kuja.

20. Ma ì nāchọ ka i mara, gi madu efu, na okwukwe bu ihe nādighi-aluputa ihe ma ọlu adighi ya?

21. Èsiteghi n'ọlu gu Abraham nna-ayi n'onye ezi omume, mb͕e ọ churu Aisak nwa-ya nwoke n'elu ebe-ichu-àjà?

22. I huwo na okwukwe-ya soro ọlu-ya lukọ ọlu, esite-kwa-ra n'ọlu ahu me ka okwukwe ahu zue okè;

23. ewe mezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke nāsi, Abraham we kwere okwu Chineke, ewe gua ya nye ya n'ezi omume; ewe kpọ ya eyì nke Chineke.

24. Unu ahuwo na anēsite n'ọlu gu madu n'onye ezi omume, adighi-esite kwa nání n'okwukwe.

25. Ma n'uzọ di otù a èsiteghi kwa n'ọlu gu Rehab, bú nwanyi nākwa iko, n'onye ezi omume, mb͕e ọ kpọbatara ndi-ozi ahu, we zipu ha n'uzọ di iche?

26. N'ihi na dika aru bu ihe nwuru anwu ma mọ adighi ya, ọbuná otú a okwukwe bu ihe nwuru anwu ma ọlu adighi ya.

About Jemes Chapter 2

Read Jemes Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jemes in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Jemes
Chapter: 2
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jemes. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Jemes Chapter 2 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Jemes Chapter 2?

Jemes Chapter 2 is part of the Book of Jemes in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Jemes Chapter 2 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 1
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 13

Explore More from jemes

  1. Jemes Chapter 1
  2. Jemes Chapter 3
  3. Jemes Chapter 4
  4. Jemes Chapter 5

Related Chapters & Readings

  1. Ezikiel Chapter 37
  2. Esta Chapter 2
  3. I. Ihe Emere Chapter 23
  4. II. Ihe Emere Chapter 30
  5. Abù Ọma Chapter 90
  6. Ọpupu Chapter 11
  7. Jeremaia Chapter 52
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *