Read Joshua Chapter 4 Online
Read Joshua Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Joshua and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Joshua 4
Isi 4
1. O rue, mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan, na Jehova gwara Joshua okwu, si,
2. Werenu n'onwe-unu ndikom iri na abua sitere na ndim, otù nwoke otù nwoke n'ebo ọ bula,
3. nye-kwa-nu ha iwu, si, Bupuru onwe-unu n'ebe a, n'etiti Jọdan, n'ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà, nkume iri na abua, bubiga ha n'etiti unu, dọba ha n'ọnọdu-abali ahu, ebe unu gānọ abali ta.
4. Joshua we kpọ ndikom iri na abua ahu, ndi o doziworo site n'umu Israel, otù nwoke otù nwoke site n'ebo ọ bula:
5. Joshua we si ha, Gabiganu n'iru ib͕e Jehova, bú Chineke-unu, rue etiti Jọdan, buliere onwe-unu, nwoke ọ bula otù nkume, tukwasi n'elu ubu-ya, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di:
6. ka nka we buru ihe-iriba-ama n'etiti unu, mb͕e umu-unu gāju ajuju n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi nkume ndia n'ebe unu nọ?
7. unu gāsi kwa ha, N'ihi na ebipuru miri Jọdan n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; mb͕e ọ gabigara Jọdan, ebipuru miri Jọdan: nkume ndia gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ncheta rue mb͕e ebighi-ebi.
8. Umu Israel we me otú a, dika Joshua nyere ha iwu, ha we bupu nkume iri na abua n'etiti Jọdan, dika Jehova gwara Joshua okwu, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di; ha we bubiga ha n'etiti ha rue ọnọdu-abali-ha, we dọba ha n'ebe ahu.
9. Joshua we guzo nkume iri na abua n'etiti Jọdan, bú ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu: ha we di n'ebe ahu, rue ta.
10. Ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ahu nēguzo kwa n'etiti Jọdan, rue mb͕e emezuru okwu ahu nile nke Jehova nyere Joshua n'iwu igwa ndi Israel, dika ihe ahu nile si di nke Moses nyere Joshua n'iwu: ndi Israel we me ngwa gabiga.
11. O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n'iru ndi Israel.
12. Umu Reuben, na umu Gad, na nkera ebo Manase, we gabiga n'iru umu Israel, chiri ihe-ekike-agha, dika Moses gwara ha okwu:
13. dika orú nnù uzọ ise, ndi ejikere nke usu-ndi-agha, gabigara n'iru Jehova ibu agha, rue ala ihe nādighi nke Jeriko.
14. N'ubọchi ahu ka Jehova mere Joshua ka ọ di uku n'anya Israel nile; ha we tua egwu ya, dika ha turu egwu Moses, ubọchi nile nke ndu-ya.
15. Jehova we gwa Joshua okwu, si,
16. Nye ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ihe-àmà iwu, ka ha si na Jọdan rigota.
17. Joshua we nye ndi-nchu-àjà iwu, si, Sinu na Jọdan rigota.
18. O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova siri n'etiti Jọdan rigota, mb͕e ndi-nchu-àjà sepuru ọbu-ukwu-ha rue ala-akọrọ, na miri Jọdan laghachiri n'ọnọdu-ya, we ruchie akuku-ya nile, dika na mb͕e gara aga.
19. Ndi Israel we si na Jọdan rigota n'ubọchi nke-iri nke ọnwa mbu, má ulo-ikwū-ha na Gilgal, na nsọtu ọwuwa-anyanwu Jeriko.
20. Nkume iri na abua ahu, nke ha si na Jọdan were, Joshua we guzo ha na Gilgal.
21. Ọ we gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e umu-unu gāju ndi bu nna-ha ajuju n'ọdi-n'iru, si, Gini bi isi nkume ndia?
22. Unu gēme kwa ka umu-unu mara, si, N'ala-akọrọ ka Israel gabigara Jọdan nka.
23. N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, mere ka miri Jọdan takọrọ n'iru unu, rue mb͕e unu gabigara, dika Jehova, bú Chineke-unu, mere Oké Osimiri Uhie, nke O mere ka ọ takọrọ n'iru ayi, rue mb͕e ayi gabigara:
24. ka ndi nile nke uwa we mara aka Jehova, na ike ka ọ di; ka ha we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile.
About Joshua Chapter 4
Read Joshua Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Joshua
Chapter: 4
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Joshua. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Joshua Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Joshua Chapter 4?
Joshua Chapter 4 is part of the Book of Joshua in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Joshua Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Esta Chapter 1
- Aisaia Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Esta Chapter 5
- Esta Chapter 4
- Esta Chapter 7
- Job Chapter 33
Explore More from joshua
- Joshua Chapter 2
- Joshua Chapter 18
- Joshua Chapter 21
- Joshua Chapter 7
- Joshua Chapter 3
- Joshua Chapter 1
- Joshua Chapter 15