Ọnu-Ọgugu Chapter 27

For English

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 27 Online

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 27 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọnu-Ọgugu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ọnu-Ọgugu 27

Isi 27

1. Ha we biarue nso, bú umu-ndinyom Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, nke ab͕uru Manase nwa Josef: ndia bu aha umu-ya ndinyom; Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.

2. Ha we guzo n'iru Moses, na n'iru Eleeza, bú onye-nchu-aja, na n'iru ndi-isi na nzukọ Israel nile, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, si,

3. Nna-ayi nwuru n'ọzara, ma ya onwe-ya adighi n'etiti nzukọ ahu ndi nēzukọ imegide Jehova nime nzukọ Kora: ma nime nmehie nke aka ya ka ọ nwuru: ma ọ dighi umu-ndikom o nwere.

4. N'ìhi gini ka agāgupu aha nna-ayi n'etiti ab͕uru-ya, n'ihi na o nweghi nwa-nwoke? Nye ayi ihe-onwunwe n'etiti umu-nne-nna-ayi ndikom.

5. Moses we weta ikpé-ha nso n'iru Jehova.

6. Jehova we gwa Moses okwu, si,

7. Ọ bu ihe ziri ezi ka umu-ndinyom Zelọfehad nēkwu: i ghaghi inye ha ihe-onwunwe nke ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha ndikom; i gēme kwa ka ihe-nketa nna-ha gabiga rue ha aka.

8. Ọ bu kwa umu Israel ka i gāgwa okwu, si, Mb͕e nwoke gānwu, ma o nweghi nwa-nwoke, unu gēme kwa ka ihe-nketa-ya gabiga rue nwa-ya nwayi aka.

9. Ma ọ buru na o nweghi nwa-nwayi, unu gēnye kwa umunne-ya ndikom ihe-nketa-ya.

10. Ma ọ buru na ọ nweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa umu-nne nna-ya ndikom ihe-nketa-ya.

11. Ma ọ buru na nna-ya enweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa onye-aru-ya nke di ya nso site n'ab͕uru-ya ihe-nketa-ya, ọ gēnweta kwa ya: ọ gābu-kwa-ra umu Israel ukpuru ikpé, dika Jehova nyere Moses iwu.

12. Jehova we si Moses, Rigo n'ugwu Abarim nka, hu kwa ala ahu nke M'nyeworo umu Israel.

13. Ma mb͕e i huworo ya, agāchikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ, ọbuná gi onwe-gi, dika achikọtara Eron, bú nwa-nne-gi na umu-nna-ya:

14. n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum n'ọzara Zin, n'ise-okwu ahu nke nzukọ Israel, bú nke M'gwara unu me, idom nsọ na miri ahu n'anya-ha (Miri ahu bu miri Meriba Kedesh n'ọzara Zin.)

15. Moses we gwa Jehova okwu, si,

16. Ka Jehova, bú Chineke nke mọ anu-aru nile, bú madu, nwere, Ya me otù nwoke ka ọ buru onye-nlekọta nzukọ a,

17. onye ganāpu apu n'iru ha, onye ganābà kwa abà n'iru ha, onye ganēme kwa ka ha nāpu apu, onye ganēme kwa ka ha nābà abà; ka nzukọ Jehova we ghara idi ka ìgwè ewu na aturu nke nēnweghi onye-ọzùzù.

18. Jehova we si Moses, Kuru n'onwe-gi Joshua nwa Nun, bú nwoke nke Mọm di nime ya, bikwasi ya aka-gi;

19. guzo kwa ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọm nile; nye ya iwu n'anya-ha.

20. I gātukwasi kwa ya ufọdu nime ebube-gi, ka nzukọ nile nke umu Israel we nu.

21. Ọ bu kwa n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ka ọ gēguzo, onye gājuru ya ase n'ikpé Ìhe ahu n'iru Jehova: n'okwu-ọnu-ya ka ha ganāpu apu, ọ bu kwa n'okwu-ọnu-ya ka ha ganābà-abà, ya onwe-ya, na umu Israel nile tiyere ya, bú nzukọm nile.

22. Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: o we kuru Joshua, guzo ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọ Israel nile:

23. o we bikwasi ya aka-ya abua, nye kwa ya iwu, dika Jehova kwuru n'aka Moses.

About Ọnu-Ọgugu Chapter 27

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 27 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ọnu-Ọgugu
Chapter: 27
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọnu-Ọgugu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ọnu-Ọgugu Chapter 27 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ọnu-Ọgugu Chapter 27?

Ọnu-Ọgugu Chapter 27 is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ọnu-Ọgugu Chapter 27 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 7
  6. Esta Chapter 4
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from ọnu ọgugu

  1. Ọnu-Ọgugu Chapter 2
  2. Ọnu-Ọgugu Chapter 4
  3. Ọnu-Ọgugu Chapter 11
  4. Ọnu-Ọgugu Chapter 14
  5. Ọnu-Ọgugu Chapter 20
  6. Ọnu-Ọgugu Chapter 33
  7. Ọnu-Ọgugu Chapter 7

Related Chapters & Readings

  1. Jenesis Chapter 16
  2. Ndi-Ikpe Chapter 3
  3. II. Ndi-Eze Chapter 15
  4. Ọnu-Ọgugu Chapter 9
  5. Aisaia Chapter 15
  6. I. Ndi Kọrint Chapter 8
  7. Luk Chapter 2
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *