II. Ndi-Eze Chapter 1

For English

Read II. Ndi-Eze Chapter 1 Online

Read II. Ndi-Eze Chapter 1 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi-Eze in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ndi-Eze and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

II. Ndi-Eze 1

Isi 1

1. Moab we jehie megide Israel mb͕e ọnwu Ehab gasiri.

2. Ehazaia we dapu n'ihe-ọkpukpa window nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, o we ria ọria: o ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Beal-zebub, bú chi Ekron, ase ma m'gādiri ndu n'ọria nka.

3. Ma mọ-ozi Jehova gwara Elaija, bú onye Tisbe, okwu, si, Bilie, rigo izute ndi-ozi eze Sameria, gwa ha okwu, si, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel, na unu onwe-unu nēje iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase?

4. Ma n'ihi nka otú a ka Jehova siri, Ihe-ndina ahu ebe i rigoro, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu. Elaija we la.

5. Ndi-ozi ahu we laghachikuru ya, ọ si ha, Gini bu nka na unu laghachiworo?

6. Ha si ya, Otù nwoke rigotara izute ayi, ọ si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zìri unu, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel na gi onwe-gi nēziga iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.

7. Ọ si ha, Òle aha madu ọ bu, bú nwoke ahu nke rigoro izute unu, we gwa unu okwu ndia?

8. Ha si ya, Ọ bu nwoke nwere aji nke-uku, eke-kwa-ra ya ihe-ọkiké akpukpọ n'úkwù-ya. Ọ si, Elaija onye Tisbe ka ọ bu.

9. O we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. O we rigokuru ya: ma, le, ọ nānọdu n'elu ugwu. O we gwa ya okwu, si, Gi onye nke Chineke, Eze asiwo, Ridata.

10. Elaija we za, si onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ahu, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.

11. O we ziga-kwa-ra ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ọzọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Ọ za, si ya, Onye nke Chineke, otú a ka eze siworo, Ngwa ngwa, ridata.

12. Elaija we za, si ha, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku nke Chineke we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.

13. Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n'ala n'iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n'anya-gi.

14. Le, ọku siri n'elu-igwe ridata, ripia ndi-isi abua mbu ahu nke ọgu ndi-agha abua na iri, ha na ọgu ndi-agha abua na iri ha: ma ub͕u a ka ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi.

15. Mọ-ozi nke Jehova we si Elaija, Soro ya rida: atula egwu ya. O we bilie, soro ya ridakuru eze.

16. O we gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zigawo ndi-ozi iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase, ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel iju ase okwu-Ya? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.

17. O we nwua, dika okwu Jehova si di nke Elaija kwuru. Jehoram we malite ibu eze n'ọnọdu ya n'arọ nke-abua nke Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda; n'ihi na o nweghi nwa-nwoke.

18. Ma ihe Ehazaia nile nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

About II. Ndi-Eze Chapter 1

Read II. Ndi-Eze Chapter 1 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi-Eze in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: II. Ndi-Eze
Chapter: 1
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ndi-Eze. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading II. Ndi-Eze Chapter 1 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is II. Ndi-Eze Chapter 1?

II. Ndi-Eze Chapter 1 is part of the Book of II. Ndi-Eze in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete II. Ndi-Eze Chapter 1 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 7
  6. Esta Chapter 4
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from ii-ndi-eze

  1. II. Ndi-Eze Chapter 22
  2. II. Ndi-Eze Chapter 24
  3. II. Ndi-Eze Chapter 2
  4. II. Ndi-Eze Chapter 11
  5. II. Ndi-Eze Chapter 14
  6. II. Ndi-Eze Chapter 21
  7. II. Ndi-Eze Chapter 3

Related Chapters & Readings

  1. Levitikọs Chapter 17
  2. Jọn Chapter 12
  3. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 26
  4. Deuteronomi Chapter 8
  5. Abù Ọma Chapter 45
  6. Luk Chapter 11
  7. Aisaia Chapter 64
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *