Ọnu-Ọgugu Chapter 30

For English

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 30 Online

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 30 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọnu-Ọgugu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

A+ A A-

Ọnu-Ọgugu 30

Isi 30

1. Moses we gwa ndi-isi nke ebo nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe nke Jehova nyeworo n'iwu.

2. Nwoke ọ bula, mb͕e ọ gēkwe Jehova nkwa, ma-ọbu mb͕e ọ gāṅu iyi iwere isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ọ gaghi-eme ka okwu-ya ghara idi nsọ; dika ihe nile si di nke nēsi n'ọnu-ya puta, otú a ka ọ gēme.

3. Nwayi kwa, mb͕e ọ gēkwe Jehova nkwa, were kwa isọ-nsọ ke onwe-ya ab͕u, n'ulo nna-ya, mb͕e ọ di na nwata;

4. nna-ya we nu nkwa-ya, na isọ-nsọ-ya o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ma nna-ya b͕ara ya nkiti: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u gēguzosi kwa ike.

5. Ma ọ buru na nna-ya si ya, É-è, n'ubọchi ọ nuru ya; ọ dighi ihe ọ bula nime nkwa-ya nile, ma-ọbu nime isọ-nsọ-ya nile nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi ike: Jehova gab͕aghara kwa ya, n'ihi na nna-ya si ya, É-è.

6. Ma ọ buru na nwoke alua ya na nwunye ma-ọli, mb͕e nkwa-ya nile dikwasi ya, ma-ọbu okwu efu ahu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya, nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u;

7. di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti n'ubọchi ọ nuru ya: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ nile, nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi kwa ike.

8. Ma ọ buru na di-ya si ya, É-è, n'ubọchi ọ nuru ya; ọ gēmebi kwa nkwa-ya nke dikwasi ya, na okwu efu ahu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya, nke o ji ke nkpuru-obi-ya: Jehova gāb͕aghara kwa ya.

9. Ma nkwa nke nwayi di-ya nwuru, ma-ọbu nke nwayi achupuru achupu, bú ihe ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, o gēguzosi ike megide ya.

10. Ma ọ buru na ọ bu n'ulo di-ya ka o kwere nkwa, ma-ọbu were isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u n'iṅu-iyi,

11. di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti, ọ sighi kwa ya, É-è; nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u gēguzosi kwa ike.

12. Ma ọ buru na di-ya emebisia ha n'ubọchi ọ nuru ha; ihe ọ bula nke nēsi n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya puta bayere nkwa-ya nile, ma-ọbu nke bayere isọ-nsọ nke nkpuru-obi-ya, ọ gaghi-eguzosi ike: di-ya emebiwo ha; Jehova gāb͕aghara kwa ya.

13. Nkwa ọ bula, na iyi isọ-nsọ ọ bula iji weda nkpuru-obi n'ala, di-ya gēme ka o guzosi ike, ma-ọbu di-ya gēmebi ya.

14. Ma ọ buru na di-ya ab͕achie ya nkiti site n'ubọchi rue ubọchi: o mewo kwa nkwa-ya nile, ma-ọbu isọ-nsọ-ya nile, nke dikwasi ya, ka ha guzosie ike: o mewo ka ha guzosie ike, n'ihi na ọ b͕ara ya nkiti n'ubọchi ọ nuru ha.

15. Ma ọ buru na o mebisia ha mb͕e ọ nusiri ha; ọ gēbu kwa ajọ omume nwayi ahu.

16. Ndia bu ukpuru, nke Jehova nyere Moses n'iwu. n'etiti nwoke na nwunye-ya, n'etiti nna na nwa-ya nwayi, mb͕e ọ di na nwata n'ulo nna-ya.

About Ọnu-Ọgugu Chapter 30

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 30 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ọnu-Ọgugu
Chapter: 30
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọnu-Ọgugu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ọnu-Ọgugu Chapter 30 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ọnu-Ọgugu Chapter 30?

Ọnu-Ọgugu Chapter 30 is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ọnu-Ọgugu Chapter 30 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from ọnu ọgugu

  1. Ọnu-Ọgugu Chapter 15
  2. Ọnu-Ọgugu Chapter 36
  3. Ọnu-Ọgugu Chapter 7
  4. Ọnu-Ọgugu Chapter 21
  5. Ọnu-Ọgugu Chapter 31
  6. Ọnu-Ọgugu Chapter 11
  7. Ọnu-Ọgugu Chapter 9

Related Chapters & Readings

  1. II. Ihe Emere Chapter 14
  2. Aisaia Chapter 34
  3. Ọnu-Ọgugu Chapter 2
  4. Abù Ọma Chapter 37
  5. Abù Ọma Chapter 47
  6. Ezikiel Chapter 3
  7. Abù Ọma Chapter 100
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *