Read Aisaia Chapter 45 Online
Read Aisaia Chapter 45 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Aisaia and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Aisaia 45
Isi 45
1. Otú a ka Jehova siri onye-Ya etere manu, bú Sairọs, onye M'jideworo aka-nri-ya, izọda mba di iche iche n'iru ya, ọ bu kwa úkwù ndi-eze ka M'gēkepu; imeghe uzọ n'iru ya, agaghi-emechibido kwa ọnu-uzọ-ama;
2. Mu onwem gāga n'iru-gi, me ka nkputankpu ebe nile guzozie: ibo-ọnu-uzọ ọla nile ka M'gētiwa, ihe-ntuchi ígwè nile ka M'gēb͕ujipu kwa:
3. M'gēnye kwa gi àkù nke ọchichiri, na àkù zoro ezo nke ebe nzuzo di iche iche, ka i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye ahu Nke nākpọ gi n'aha-gi, ọbuná Chineke Israel.
4. N'ihi orùm, bú Jekob, na Israel nke M'rọputara, ka M'nākpọ gi n'aha-gi: anametu gi aha, ọ bu ezie na i maghm.
5. Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di; ma ewezuga náním ọ dighi Chineke ọ bula di: M'nēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, ọ bu ezie na i maghm:
6. ka ha we mara site n'ọwuwa anyanwu, site kwa n'Ọdida-anyanwu, na ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli ma ewezuga náním: Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di.
7. Abum Onye nākpu ìhè na Onye nēkè ọchichiri; abum Onye nēme udo na Onye nēkè ihe ọjọ: Mu onwem bu Jehova, Onye nēme ihe ndia nile.
8. Unu elu-igwe, nātasinu ezi omume site n'elu, ka mbara-ígwé nile nēzoda kwa ezi omume dika miri: ka ala meghe onwe-ya, ka ha we mia nzọputa dika nkpuru, ka o me kwa ezi omume ka ọ pukọ n'otù; Mu onwem, bú Jehova, ekèwo ya.
9. Ahuhu gādiri onye nāluso Onye kpuworo ya ọ̀gù! otù ejùjù nile nke ala! Urọ, ọ̀ gāsi onye nākpu ya, Gini ka i nālu? ma-ọbu ọlu-gi, ọ̀ gasi, Ọ dighi aka abua o nwere?
10. Ahuhu gādiri onye nāsi nna-ya, Gini ka i nāmu? nke nāsi kwa nwanyi, Ìme gini nēme gi?
11. Otú a ka Jehova siri, bú Onye Nsọ nke Israel na Onye kpuworo ya: Juanum ajuju bayere ihe nile nābia; nyenum iwu bayere umum, ma-ọbu bayere ọlu akam abua.
12. Mu onwem emewo uwa, kè kwa madu n'elu ya: Mu onwem, akam abua setiri elu-igwe, ọ bu usu nile nke ihe-ha M'nyeworo iwu.
13. Mu onwem akpọtewo ya n'ezi omume, ọ bu kwa uzọ-ya nile ka M'gēme ka ha guzozie: onye ahu gēwu obodom, zilaga ndim emereri ka ha je biri n'ala ọzọ, ọ bughi n'ihi ọnu-ahia, ọ bughi kwa n'ihi iri-ngo, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
14. Otú a ka Jehova siri, Ihe putara na ndọb͕u Ijipt nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ọzuzu-ahia nke Etiopia, na ndi Saba, ndi toro ogologo, gāgabigakute gi, ndi i nwere ka ha gābu kwa; gi ka ha gēso n'azu; na nkpọrọ ka ha gāgabiga: ọ bu kwa gi ka ha gākpọ isi ala nye, gi ka ha gēkpere, si, N'ezie nime gi ka Chineke nọ; ọ dighi kwa onye ọzọ di, ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli.
15. N'ezie Gi onwe-gi bu Chineke Nke nēzobe Onwe-gi, Gi Chineke Israel, bú Onye-nzọputa.
16. Ihere emewo ha, e, etiyewo kwa ha n'ọnọdu-ihere, ha nile: n'otù ka ha lakọworo n'ọnọdu-ihere, bú ndi-ọ̀kà nēb͕u arusi eb͕uru eb͕ubu.
17. Jehova ejiwo nzọputa ebighi-ebi zọputa Israel: ihere agaghi-eme unu, agaghi-etiye kwa unu n'ọnọdu-ihere rue mb͕e nile ebighi-ebi.
18. N'ihi na otú a ka Jehova Nke kèworo elu-igwe siri; Ya onwe-ya bu Chineke: Onye kpuworo uwa, me ya; Ya onwe-ya mere ka o guzosie ike, ọ bughi ihe tọb͕ọrọ n'efu ka Ọ kère ya, ọ bu ka ewe biri nime ya ka Ọ kpuru ya: Mu onwem bu Jehova; ọ dighi kwa Chineke ọzọ di.
19. Ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu, n'otù ebe nke ala ọchichiri; asighm nkpuru Jekob, Chọnum n'ebe tọb͕ọrọ n'efu: Mu onwem bu Jehova, Onye nēkwu ezi omume, Onye nēgosi ihe di iche iche ziri ezi.
20. Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.
21. Gosinu, weta-kwa-nu ha nso; e, ka ha b͕akọ ìzù n'otù: ònye mere ka anu ihe a site na mb͕e gara aga? onye sitere na mb͕e ochie gosi ya? ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? ọ dighi kwa Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem; Chineke Nke nēme ezi omume na onye-nzọputa adighi ma ewezuga nání Mu onwem.
22. Chenum iru, ewe zọputa unu, unu nsọtu nile nke uwa: n'ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di.
23. Ejiwom Onwem ṅua iyi, otù okwu esiwo n'ọnum puta n'ezi omume, ọ gaghi-alaghachi kwa, si, na Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru, Mu ka ire nile ọ bula gāṅuru iyi.
24. Nání na Jehova ka ezi omume nile na ike di, (mu ka agwara okwu a): Ya ka madu gābiakute, ihere gēme kwa ndi ahu nile iwe-ha di ọku megide Ya.
25. Na Jehova ka agāgu nkpuru nile nke Israel na ndi ezi omume, ọ bu kwa na Ya ka ha gānya isi.
About Aisaia Chapter 45
Read Aisaia Chapter 45 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Aisaia
Chapter: 45
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Aisaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Aisaia Chapter 45 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Aisaia Chapter 45?
Aisaia Chapter 45 is part of the Book of Aisaia in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Aisaia Chapter 45 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from Aisaia
- Aisaia Chapter 66
- Aisaia Chapter 39
- Aisaia Chapter 53
- Aisaia Chapter 63
- Aisaia Chapter 9
- Aisaia Chapter 23
- Aisaia Chapter 10