Read Jọn Chapter 19 Online
Read Jọn Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jọn and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Jọn 19
Isi 19
1. TYa mere mb͕e ahu Pailat were Jisus, pia Ya ihe.
2. Ndi-agha we kpa okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, were kwa uwe odobo b͕okwasi Ya;
3. ha we nābiakute Ya, nāsi, Ekele, Eze ndi-Ju! ha nāpia kwa Ya ihe.
4. Pailat we pu kwa ọzọ n'èzí, si ha, Le, anamekuputa Ya n'èzí nye unu, ka unu we mara na ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya.
5. Ya mere Jisus putara n'èzí, nēkpu okpu-eze ahu nke eji ogwu me, nēyi kwa uwe odobo ahu. Pailat we si ha, Le, Nwoke ahu!
6. Ya mere mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi nēje ozi huru Ya, ha tie nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, Unu onwe-unu were Ya, kpọgide kwa Ya n'obe: n'ihi na mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmhie nime Ya.
7. Ndi-Ju zara ya, si, Ayi onwe-ayi nwere iwu, ma dika iwu ahu si di O kwesiri inwu ọnwu, n'ihi na O mere Onwe-ya Ọkpara Chineke.
8. Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu a, ọ tukariri egwu;
9. o we ba nime Pritoriọm ọzọ, we si Jisus, Òle ebe Gi onwe-gi si bia? ma ọ dighi ọziza Jisus zara ya.
10. Ya mere Pailat si Ya, Ì dighi-agwam okwu? Ì mataghi na m'nwere ike irapu Gi, m'nwe-kwa-ra ike ikpọgide Gi n'obe?
11. Jisus zara ya, si, I gaghi-enwe ike ọ bula imegidem, ọ buru na esighi n'elu nye gi ya-ri: n'ihi nka onye raram nye n'aka-gi nwere nmehie kari.
12. Site na nka Pailat nāchọ uzọ irapu Ya: ma ndi-Ju tiri nkpu, si, Ọ buru na i rapu Onye a, i bughi eyì Sisa: onye ọ bula nke nēme onwe-ya eze nēkwu okwu imegide Sisa.
13. Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu ndia, o duputa Jisus n'èzí, we nọkwasi oche-ikpé n'ebe anākpọ Pavement, ma n'asusu Hibru, Gabata.
14. Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe nke ememe ngabiga: ọ di ka oge hour nke-isi. O we si ndi-Ju, Le, Eze-unu!
15. Ya mere ndi ahu tiri nkpu, si, Wepu Ya, wepu Ya, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, M'gākpọgide Eze-unu n'obe? Ndi-isi-nchu-àjà zara, si, Ayi enweghi eze ma-ọbughi Sisa.
16. Ya mere mb͕e ahu ọ rara Ya nye n'aka-ha, ka ewe kpọgide Ya n'obe.
17. Ya mere ha kuru Jisus tiyere onwe-ha: O we pua, nēbu obe-Ya n'Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n'asusu Hibru Gọlgọta:
18. ebe ha kpọgidere Ya n'obe, Ya na ndikom abua ọzọ, otù n'akuku a otù n'akuku ọzọ, Jisus nọ kwa n'etiti ha.
19. Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n'elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU.
20. Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju guru ihe-ndekwasi ahu: n'ihi na ebe akpọgidere Jisus n'obe di obodo Jerusalem nso: ede-kwa-ra ya n'asusu Hibru, n'asusu Latin, n'asusu Grik.
21. Ya mere ndi-isi-nchu-àjà nke ndi-Ju si Pailat, Edela, Eze ndi-Ju; kama, na Onye ahu siri, Abum Eze ndi-Ju.
22. Pailat zara, si, Ihe m'deworo, edewom ya.
23. Ya mere ndi-agha, mb͕e ha kpọgidesiri Jisus n'obe, ha chiri uwe-Ya, kè ha òkè anọ, otù onye otù òkè otù onye otù òkè; ha chi-kwa-ra uwe-ime-Ya: ma uwe-ime ahu enweghi ọb͕ub͕a, akpara ya site n'elu we gazu n'aru uwe-ime ahu dum.
24. Ya mere ha siritara onwe-ha, Ka ayi ghara idọwa ya, kama ka ayi fere ya nzà, onye ọ gābu nke ya: ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezue, nke si, Ha kère uwem nye onwe-ha, N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha fe-kwa-ra nzà. Ya mere ndi-agha ahu mere ihe ndia.
25. Ma nne-Ya, na nwa-nne nne-Ya nke nwayi, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalini, nēguzo obe Jisus nso.
26. Ya mere mb͕e Jisus huru nne-Ya, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Ọ huru n'anya, ka o nēguzo nso, Ọ si nne-Ya, Nwanyi, le, nwa-gi nwoke!
27. Mb͕e ahu Ọ si onye ahu nke nēso uzọ-Ya, Le, nne-gi! Site n'oge hour ahu onye ahu nke nēso uzọ-Ya we kuru ya la n'ulo nke aka ya.
28. Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Ọ si, Akpiri nākpọm nku.
29. Adọbara n'ebe ahu ite nke manya-vine b͕ara uka juru: ya mere ha were sponge nke manya-vine ahu b͕ara uka juru tukwasi n'elu osisi hyssop, che Ya n'ọnu.
30. Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.
31. Ya mere ndi-Ju, ebe ọ bu ubọchi Nkwadebe, ka aru-ha we ghara idigide n'elu obe n'ubọchi-izu-ike (n'ihi na ubọchi-izu-ike nke ízù ahu bu oké ubọchi), ha kpere Pailat ka etijie ogwe-ukwu-ha, ka ebupu kwa ha.
32. Ya mere ndi-agha biara, tijie ogwe-ukwu nke onye mbu, na nke onye ọzọ, nke akpọgidere Ya na ya n'obe:
33. ma mb͕e ha biaruru Jisus, hu kwa na Ọ nwuwori ub͕u a, ha etijighi ogwe-ukwu-Ya:
34. otú ọ di, otù onye n'etiti ndi-agha were ube ma Ya n'akuku, ngwa ngwa ọbara na miri we puta.
35. Onye huworo ya ab͕awo kwa àmà, àmà-ya bu kwa ezie: onye ahu nāmata kwa na o nēkwu ezi-okwu, ka unu onwe-unu we kwere kwa.
36. N'ihi na ihe ndia mere, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Agaghi-etiji otù ọkpukpu-Ya.
37. Ọzọ kwa, ihe ọzọ di iche edeworo n'akwukwọ nsọ si, Ha gēlegide Onye ahu Nke ha mapúru amapú.
38. Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Josef nke Arimatia, ebe o nēso uzọ Jisus, ma na nzuzo n'ihi egwu ndi-Ju, o kpere Pailat ka o bupu aru Jisus: Pailat we kwere ya. Ya mere ọ biara, bupu aru-Ya.
39. Nikọdimọs, onye biakutere Ya n'abali na mbu, bia-kwa-ra, nēweta myrrh na aloes agwara, ihe ra ka ọgu pound ise n'ọtùtù.
40. Ya mere ha were aru Jisus, ke ya n'ezi ákwà-ozu, ya na udá utọ ndia, dika ndi-Ju nēme n'ilì ozu.
41. Ma n'ebe akpọgidere Ya N'obe otù ubi ab͕ara ogige di; nime ubi ab͕ara ogige ahu ílì ọhu di kwa nke akātọb͕ọghi madu ọ bula nime ya.
42. Ya mere n'ebe ahu, n'ihi ubọchi Nkwadebe nke ndi-Ju, (n'ihi na ílì ahu di nso), ka ha tọb͕ọrọ Jisus.
About Jọn Chapter 19
Read Jọn Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Jọn
Chapter: 19
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jọn. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Jọn Chapter 19 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Jọn Chapter 19?
Jọn Chapter 19 is part of the Book of Jọn in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Jọn Chapter 19 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6