Read Levitikọs Chapter 3 Online
Read Levitikọs Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Levitikọs in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Levitikọs and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Levitikọs 3
Isi 3
1. Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ihe àjà nke àjà-udo; ọ buru na ọ bu ihe si n'ìgwè ehi puta ka ya onwe-ya nēweta nso, ma ọ bu oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso n'iru Jehova.
2. O gēbikwasi aka-ya n'isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
3. O gēsi kwa n'ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova; bú abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,
4. na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku ákwù-ya, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwuzuga ya).
5. Umu-ndikom Eron gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku, nke di n'elu nkú nke di n'elu ọku: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova.
6. Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso, nke, ọ nēnye ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo ichuru Jehova, esi n'ìgwè ewu na aturu puta; oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso.
7. Ọ buru na ọ bu aturu ka ya onwe-ya nēweta nso ibu onyinye-ya iji biaru nso, ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova:
8. ọ gēbikwasi aka-ya n'isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n'iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
9. O gēsi kwa n'ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova: bú abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba n'izu-okè-ya, (n'ebe ọkpukpu-azu-ya di ka ọ gēwezuga ya); na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,
10. na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya).
11. Onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku anāchuru Jehova.
12. Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ewu, ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova.
13. O gēbikwasi aka-ya n'isi-ya, b͕u kwa ya n'iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
14. O gēsi kwa nime ya weta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova; abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,
15. na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya).
16. Onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku, ka ọ buru ihe ísì utọ: abuba nile bu ihe Jehova nwere.
17. Ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile, na unu agaghi-eri abuba ọ bula ma-ọbu ọbara ọ bula.
About Levitikọs Chapter 3
Read Levitikọs Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Levitikọs in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Levitikọs
Chapter: 3
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Levitikọs. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Levitikọs Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Levitikọs Chapter 3?
Levitikọs Chapter 3 is part of the Book of Levitikọs in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Levitikọs Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
Explore More from levitikọs
- Levitikọs Chapter 24
- Levitikọs Chapter 10
- Levitikọs Chapter 27
- Levitikọs Chapter 8
- Levitikọs Chapter 21
- Levitikọs Chapter 5
- Levitikọs Chapter 1