Read Malakai Chapter 2 Online
Read Malakai Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Malakai in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Malakai and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Malakai 2
Isi 2
1. Ma uḅu a, unu ka ihe a enyere n'iwu diri, unu ndi-nchu-àjà.
2. Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi.
3. Le, M'gaje ibasiri nkpuru-ọghigha nba ike n'ihi unu, fesa unu ǹsí-anu n'iru, bú ǹsí-anu nke anu ememe nile unu; agēbupu unu je n'ebe ọ di.
4. Unu ewe mara na eziteworom unu ihe a enyere n'iwu, ka ọḅuḅa-ndum we diyere Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
5. Ọgbugha-ndum diyere ya, bú ndu na udo; M'we nye ya ha dika ihe-egwu, o we tua egwum, ọ bu kwa aham ka ya onwe-ya turu ujọ ya.
6. Iwu nke ezi-okwu di n'ọnu-ya, ahughi kwa ajọ omume n'eḅuḅere-ọnu-ya: n'udo na n'izi-ezi ka o sorom je ije, ọ di kwa ọtutu madu o mere ka ha si n'ajọ omume chigharia.
7. N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.
8. Ma unu onwe-unu ewezugawo onwe-unu n'uzọ Chineke; unu emewo ka ọtutu madu su ngọngọ n'iwu; unu ebibiwo ọḅuḅa-ndu Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
9. Ma Mu onwem emewo kwa ka unu buru ndi anēlelì na ndi di ala n'iru ndim nile, dika unu nādighi-esi edebe uzọm nile, kama unu nāhu madu iru-ọma n'iwu.
10. Ọ̀ bughi otù Nna ka ayi nile nwere? ọ̀ bughi otù Chineke keworo ayi? gini mere ayi nāghọḅu, onye ọ bula ọ ghọḅu ibe-ya, nēme ka ọḅuḅa-ndu nna-ayi-hà ghara idi nsọ?
11. Juda aghọḅuwo nghọḅu, ọ bu kwa ihe-árú ka emeworo n'Israel na nime Jerusalem; n'ihi na Juda emewo ka idi-nsọ Jehova nke Ọ huworo n'anya ghara idi nsọ, ọ luwo kwa nwa-nwan yi nke chi ala ọzọ.
12. Jehova gēbipuru onye ahu nke nēme nka onye nēteta eteta na onye nāza aza, n'ulo-ikwū nile nke Jekob, ya na onye nēwetara Jehova nke usu nile nke ndi-agha nso onyinye-inata-iru ọma.
13. Ọ bu kwa nka nke mere ya abua ka unu nēme: unu ji anya-miri na ikwa-ákwá na isu-udè ekpuchi ebe-ichu-àjà Jehova, O we ghara iche kwa onyinye-inata-iru-ọma ọzọ, ọ tọghi kwa Ya utọ inara ya n'aka-unu.
14. Ma unu asiwo, N'ìhi gini? N'ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n'etiti gi na nwunye i lutara n'okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi.
15. Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia.
16. N'ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu.
17. Unu ejiwo okwu nile unu me ka ike gwu Jehova. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi meworo ka ike gwu Ya? N'isi, Onye ọ bula nke nēme ihe ọjọ di nma n'anya Jehova, ọ bu kwa ihe-ha nātọ Ya onwe-ya utọ; ma-ọbu òle ebe Chineke nke ikpé nọ?
About Malakai Chapter 2
Read Malakai Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Malakai in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Malakai
Chapter: 2
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Malakai. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Malakai Chapter 2 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Malakai Chapter 2?
Malakai Chapter 2 is part of the Book of Malakai in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Malakai Chapter 2 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
Explore More from malakai
- Malakai Chapter 1
- Malakai Chapter 1
- Malakai Chapter 4
- Malakai Chapter 2
- Malakai Chapter 4
- Malakai Chapter 3
- Malakai Chapter 3